Otulu, Ahiara

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

   

Otulu bụ otu n'ime obodo iri nke Ahiara, Imo State, Nigeria. O nwere obodo nta itoolu, ha gụnyere:

  • Ihite*
  • Umuokoro
  • Umuaghara
  • Umuagwu
  • Umugaa
  • Umuakam
  • Umuorise
  • Umuoke
  • Umuoyaa

Ndị Otulu nwere nnukwu ahịa a na-akpọ Nkwo Otulu. Obodo a bụ ndị Katọlik, nwere Parish a na-akpọ St. Joseph Catholic Parish Otulu. Ha nwere otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Community Secondary School Otulu nke obodo ahụ wuru na mbido afọ iri asatọ. Tupu ụlọ akwụkwọ sekọndrị, e nwere ụlọ akwụkwọ praịmarị abụọ, ụlọ akwụkwọ praịmarị́ St Joseph Otulu bụ nke kachasị na Group School Otulu.Àtụ:Populated places of Imo State