Owen Maseko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Owen Maseko
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịZimbabwe Dezie
Aha enyereOwen Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Ọgọọst 1975 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Owen Maseko (amụrụ na 24 Ọgọstụ 1975) bụ onye Zimbabwe na-ese ihe, nke a kọwara dị ka "otu n'ime ndị na-ese ihe a ma ama na Zimbabwe".[1][2][1][3]

Na Machị 2010, e jidere ya "ihe na-erughị awa ịrị abụọ na anọ ka emeghechara ihe ngosi ọhụrụ ya" na National Gallery na Bulawayo. Ọrụ ya ruturu aka na ogbugbu nke ndị Ndebele n'oge Gukurahundi n'afọ ndị 1980s, nke ndị agha na-akwado Robert Mugabe mere. Ihe ngosi ahụ, nke a na-akpọ "Sibathontisele" nwere "ihe ntinye atọ na ihe osise iri na abụọ". E boro Maseko ebubo, n'okpuru Iwu Nchebe n ọ n Nchebe Ọha, na "na-emebi ikike" nke Onye isi ala Robert Mugabe. E bokwara ya ebubo "ịkpata mmejọ nye ndị agbụrụ ma ọ bụ okpukpe". Ebubo ndị ahụ nwere ike ịbụ afọ iri abụọ n'ụlọ mkpọrọ.[1][3][4]

E nyere ya mgbapụta.[5] N'ọnwa Septemba, e yigharịrị ikpe ya ka Ụlọikpe Kasị Elu na-atụle ya maka "ime ka nka okike bụrụ mpụ na-emebi nnwere onwe ikwu okwu na nnwere onwe akọ na uche", dịka Iwu ahụ kwadoro. Otu onye ọkà ikpe nyere akwụkwọ n'ụlọikpe kasị elu n'ihi iwu, na n'ihi na nka Maseko gosipụtara ihe omume ndị mere n'enweghị mgbagha.[3]

Maseko bụ onye nke abụọ na-esote maka Freedom to Create Prize na 2010, maka ngosi ya na igbu ọchụ Gukurahundi.[2]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 "Zimbabwe artist defies Robert Mugabe", The Guardian, April 4, 2010
  2. 2.0 2.1 "Owen Maseko second runner up for Freedom to create prize", Zimbabwe Online Press, November 27, 2010
  3. 3.0 3.1 3.2 "Supreme court readies itself for artist Owen Maseko's case", Global Post, March 24, 2011
  4. "Top 10 Persecuted Artists: Owen Maseko", Time, April 5, 2011
  5. "Zimbabwe artist granted bail after Matabeleland exhibit", BBC, March 30, 2010