PROCONVE
Programa de Controle da Poluição do Ar por Veículos Automotores - PROCONVE (automobiles) and PROMOT (motorcycles) bụ nkewa nkè IBAMA nké na-achịkwa ikuku na Brazil.
A na-ewère ụkpụrụ ikuku nké Europe (nkè a na-eji n'ọtụtụ mba Latin America) dị ka ihe atụ.
A na-eji mkpụrụ édémédé 'L' egosi ụkpụrụ màkà obere ụgbọala. Màkà ụgbọala ndị dị arọ, a na-eji 'P' (pesados). Ọnụ ọgụgụ na-egosi ụkpụrụ siri ike màkà klas ọ bụla. Ka ọ dị ugbu a, Ln na Pn+1 jikọtara ọnụ.
Akụkụ nke oge
[dezie | dezie ebe o si]Site n'ubochi mbu n'ọnwa Jenụwarị 2012, ụgbọala ọhụrụ niile dị arọ na Brazil ga-agbaso Proconve P7 (dị ka Euro isé)[1]
Site n'ubochi mbu n'ọnwa Jenụwarị 2015, ụgbọala ọhụrụ niile dị na Brazil ga-agbaso Proconve L6 (dị ka Euro isé).[2]
Site n'ubochi mbu n'ọnwa Jenụwarị 2022, ụgbọala ọhụrụ niile dị na Brazil ga-agbaso Proconve L7 (dị ka Euro isii).[3]
Site n'ubochi mbu n'ọnwa Jenụwarị 2023, ụgbọala ọhụrụ niile dị arọ na Brazil ga-agbaso Proconve P8 (dị ka Euro isii).[4]
Site n'ubochi mbu n'ọnwa Jenụwarị 2025, ụgbọ ala ọhụrụ dị mfe na Brazil ga-agbaso ọkwa mbụ nke Proconve L8 (nkezi ụgbọ ala).[5]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Indústria pronta para Euro 5 em 2012 - Diário do Grande ABC - Notícias e informações do Grande ABC: economia. Dgabc.com.br.
- ↑ Programa de Controle da Poluição do Ar por Veículos Automotores (PDF). Ibama.gov.br. Retrieved on 26 July 2022.
- ↑ Nova lei de emissões vai tirar de linha 6 carros e 4 motores até o fim do ano; veja lista. Autoesporte.globo.com.
- ↑ Novos limites de emissões vão aquecer venda de implementos rodoviários. Estradao.estadao.com.br (11 February 2022).
- ↑ MINISTÉRIO DO MEIO AMBIENTE CONSELHO NACIONAL DO MEIO AMBIENTE RESOLUÇÃO N. 492, DE 20 DE DEZEMBRO DE 2018. Conama.mma.gov.br. Retrieved on 26 July 2022.