Pascal Aka (a mụrụ na Ivory Coast, July 17, 1985) bụ onye nduzi ihe nkiri Ivorian, onye na-eme ihe nkiri, onye nduzi vidio egwu na onye na-emepụta ihe, a maara nke ọma maka ọrụ ya na "Jamie na Eddie: Souls of Strife (2007)", "Evol (2010)",Double-Cross nke nwetara ọtụtụ nhọpụta na Ghana Movies Award nke afọ 2014.[1][2][3][4][5][6][7]
A mụrụ ya na Abidjan, Ivory Coast, Pascal Aka tolitere na Ghana.[8] Ọ gara Mahadum Carleton nke dị na Ontario ebe ọ gụrụ "ihe ọmụmụ ihe nkiri" na onye bụbu onye a na-azụ na Independent Filmmaker's Cooperative nke Ottawa, ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi nchịkwa, onye isi oche nke Kọmitii dị iche iche na osote onye isi oche. O mepụtara ihe nkiri izizi ya "Jamie and Eddie: Souls of Strife" nke o mepụtara, duzie ma soro mee ihe nkiri mgbe ọ dị afọ 21. Mgbe afọ 9 gachara na Canada, Pascal laghachiri Ghana wee malite ụlọ ọrụ mmepụta nke ya akpọrọ "Breakthrough Media Productions".[9][10]