Patusis

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Patusis
class of disease
obere ụdị nkecommensal bacterial infectious disease, Bordetella infections Dezie
ihe kpatara yaBordetella pertussis Dezie
health specialtyinfectious diseases Dezie
Ọgwụgwọ enwere ikeantibiotic Dezie
drug or therapy used for treatmenterythromycin, demeclocycline, guaifenesin Dezie
usoro nnyefe ọrịaairborne transmission, droplet infection Dezie
ICPC 2 IDR71 Dezie

Patusis, nke amakwa dịka ụkwara mkpogho maọbụ ụkwara otu narị ụbọchị, bụ ụkwara nke bụ nje n'efe.[1][2] Na mbido ọ na-eyi ka ọbụ oyi, nke n'agba onye ọ na-eme imi, oyiọmụma n'obere ụkwara. Nke n'esochi ya bụ ụkwara nke ga-adịgịde ruo ọtụtụ izu ụka. "Mkpọtụ "n'esochi mgbe onye ahụ n'eku ume.[2] Ọ na-adịgịde ruo abalị 100 maọbụ izu ụka iri.[3] Oge ụfọdụ onye ahụ n'akwasi ụkwara ike ruo mgbe obidoro gbọba agbọ, gbajie ngụgụ maọbụ nwee ike ọgwụgwụ n'ihi ya.[2][4] Ụmụaka ndị erubeghị otu afọ nwere ike ịkwa ụkwara mana ọ na-eme na ha nwere ike ịkwụsị iku ume oge ụfọdụ.[2] Ọ na-ewe ihe dịka abalị asaa ruo iri tupu ọpụtachaa nkeọma.[5] Ndị nwere ya nwetagoro ọgwụgwọ nwere ike inwekwa ya ọzọ, mana ọnaghị esicha ike.[2]

Ihe n'akpata nje a bụ nke akpọrọ Bọdetela patusis. Esi na ikuku ebuta ya, mgbe onye nwere ya mara uzere maọbụ kwaa ụkwara.[6]   Onye nwere ya n'ebunye ya ndịọzọ mana ọ na-egosi mgbe ihe dịka izu ụka atọ gasịrị. Mana ndị ejị mkpụrụọgwụ emere maka ya gwọọ anaghị enwetakarị ya.[7] Tupu eme nnyocha, a na-enweta ihe eji eme nchọpụta ma ọbụ ya ji mmadụ site n'azụ imi maọbụ akpịrị ma hapụ ya ọtụtụ ụbọchị  iji nweta ihe achọrọ.[8]

A na-egbochikarị ya site n'ịgba ọgwụ mgbochi patusis.[9] A na-atụ arọ ka agbaa ọgwụ a mgbe nwatakịrị gbara izu ụka isii na izu ụka asatọ ma hụụ n'enyere ya ugbo anọ mgbe ozuru afọ abụọ.[10] Mana ka oge n'aga ike ọgwụ ahụ n'ebelata nke na a na-atụ aro ka ndị torola mmadụ gbaa ya site n'oge ruo n'oge.[11]  Ndị nwere nnukwu nsogbu ahụike na ndị nọ ebe ha nwere ike ibute ya kwesịrị iji mkpụrụ ọgwụ n'eme ihe site na mgbe ruo na mgbe.[12] Ndị nwere ya bụ ọrịa, ọgwụ ahụ ga- arụ orụ maọbụrụ n'eji ya mee ihe mgbe ọ ka dị izu uka ato achọpụtasịrị ya, mana ọnaghị apụtacha ihie n'ebe mmadụ niile nọ. Nye ụmụaka n'erubeghị otu afọ na ụmụnwaanyị dị ime kwesịrị iji ya mee ihe mgbe ọka dị izu ụka isii obidoro.

Ọgwụ ekwesirị iji mee ihe gunyere erotromisin, azitromisin, trimetoprin/sọfametosazol.[7]   Ihe n'egosi ka ọgwụ ahụ si rụọ n'ebe ụkwara nọ apụtachaghị ihie. Ụmụaka ndị erubeghị otu afọ kwesirị ka eburu ha gaa ụlọọgwụ.

Ọrịa patusis n'emetụta ihe ruru nde mmadụ 16 n'uwa niile. kwa afọ.[13]  Ọ na-emekarị ndị bi na mba ndị n'emepe emepe nye onye ọbula n'agbanyeghị afọ ndụ onye ahụ.[9][13] N'afọ 2013, ogburu mmadụ puku 61nke di ala karia nde 138 ogburu na 1990.[4] Pasent 2 nke ndị ometụtara bụ ndị erubeghị otu afo bụ ndị ogburu.[4] Ebu ụzọ nụ maka ya ọtụtụ narị afọ gara aga, mana achọpụtara nje n'ebute ya n'afọ 1906. Ewepụtara ọgwụ ya n'afọ ndị 1940.[5]Àtụ:Infobox medical condition (new)

Njikọ[dezie | dezie ebe o si]

  1. Carbonetti NH (June 2007). "Immunomodulation in the pathogenesis of Bordetella pertussis infection and disease". Curr Opin Pharmacol. 7 (3): 272–8. doi:10.1016/j.coph.2006.12.004. PMID 17418639.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 "Pertussis (Whooping Cough) Signs & Symptoms". May 22, 2014. Retrieved 12 February 2015.
  3. "Pertussis (Whooping Cough) Fast Facts". cdc.gov. February 13, 2014. Retrieved 12 February 2015.
  4. 4.0 4.1 4.2 "Pertussis (Whooping Cough) Complications". cdc.gov. August 28, 2013. Retrieved 12 February 2015.
  5. 5.0 5.1 Atkinson, William (May 2012). Pertussis Epidemiology and Prevention of Vaccine-Preventable Diseases (12 ed.). Public Health Foundation. pp. 215–230. ISBN 9780983263135.
  6. "Pertussis (Whooping Cough) Causes & Transmission". cdc.gov. September 4, 2014. Retrieved 12 February 2015.
  7. 7.0 7.1 "Pertussis (Whooping Cough) Treatment". cdc.gov. August 28, 2013. Retrieved 13 February 2015.
  8. "Pertussis (Whooping Cough) Specimen Collection". cdc.gov. August 28, 2013. Retrieved 13 February 2015.
  9. 9.0 9.1 Heininger U (February 2010). "Update on pertussis in children". Expert review of anti-infective therapy. 8 (2): 163–73. doi:10.1586/eri.09.124. PMID 20109046.
  10. "Revised guidance on the choice of pertussis vaccines: July 2014" (PDF). Wkly Epidemiol Rec. 89 (30): 337–40. Jul 2014. PMID 25072068.
  11. "Pertussis vaccines: WHO position paper". Wkly Epidemiol Rec. 85 (40): 385–400. Oct 1, 2010. PMID 20939150.
  12. "Pertussis (Whooping Cough) Prevention". cdc.gov. October 10, 2014. Retrieved 13 February 2015.
  13. 13.0 13.1 Wang, K; Bettiol, S; Thompson, MJ; Roberts, NW; Perera, R; Heneghan, CJ; Harnden, A (22 September 2014). "Symptomatic treatment of the cough in whooping cough". The Cochrane Database of Systematic Reviews. 9: CD003257. doi:10.1002/14651858.CD003257.pub5. PMID 25243777.