Pauline Powell Burns
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha enyere | Pauline |
aha ezinụlọ ya | Burns |
ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Jụn 1876 |
Ebe ọmụmụ | Oakland |
Ụbọchị ọnwụ ya | 1912 |
Ebe ọ nwụrụ | Oakland |
Ikwu | Joseph Fossett |
ọrụ ọ na-arụ | onye ese, pianist |
ngwa egwu | Piano |
Nwere ọrụ na mkpokọta | National Museum of African American History and Culture |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | copyrights on works have expired |
Pauline Powell Burns (1872-1912) bụ ónyé America na-ese ihe na onye na-akpọ piano. Ọ bụ ónyé Africa America mbụ na-ese ihe na-egosi ihe osise na California na 1890. Powell bụkwa ónyé na-akpọ piano nke na-eme ihe ngosi gburugburu San Francisco Bay Area.
Akụkọ ezinụlọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Pauline Powell na 1872 na Oakland, California, na Josephine Turner na di ya, ónyé na-ebu ụgbọ okporo ígwè William W. Powell. Nnà nnà ya bụ Joseph Fossett, otu n'ime ndị ohu Thomas Jefferson bụ ónyé a tọhapụrụ site na iwu ya na 1826.[1] Nne nne ya Isabella Fossett bụkwa ohu ma dị ka nwatakịrị e rere ya na Monticello na 1827 dị ka akụkụ nke ụgwọ ala, mgbè e mesịrị gbalaga Boston. Nne na nna Powell kwagara Oakland, ebe amụrụ nwa ha nwanyị Pauline na 1872, afọ nné nné ya Isabella nwụrụ.
N'October 11, 1893, ọ lụrụ Edward E. Burns; ha enweghị ụmụ.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Powell gosipụtara nkà egwu na nka n'oge ọ malitere ma mụọ piano na eserese. Ọ bụ ezie na ndị Africa America na-abanye na California School of Design n'oge ahụ, o yiri ka ọ bụ ónyé nkụzi onwe ya. Ọ na-eme ihe ngosi piano n'ihu ọha n'ógbè ahụ ma ọ dịkarịa ala otu ugboro bụrụ abụ n'otu quartet na Los Angeles; ónyé édémédé Bay Area toro ya dị ka ónyé na-egbuke egbuke nke steeti ya.
A na-edebe ụfọdụ akwụkwọ metụtara ndụ Powell na Archives of California Art.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Extraordinary California Women Artists Working from 1860 to 1960 (en-US). Hyperallergic (2019-02-20). Retrieved on 2019-02-27.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "si" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "smith" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "chandler" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "alexiadis" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "fuller" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "trenton" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "weiss" defined in <references>
is not used in prior text.
Kpọpụta njehie: <ref>
tag with name "vs" defined in <references>
is not used in prior text.
<ref>
tag with name "ppb" defined in <references>
is not used in prior text.