Gaa na ọdịnaya

Phillip Zhuwao

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Phillip Zhuwao
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyerePhillip Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1971 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1997 Dezie

Phillip Zhuwao (amụrụ n'afọ 1971 - nwụọ n'afọ 1997) bụ onye Zimbabwe na-ede uri.[1]

Oge ọ malitere

[dezie | dezie ebe o si]

Zhuwao tolitere n'ezinụlọ na-agagharị agagharị, na-esi n'ugbo gaa n'ugbo, ebe nne na nna ya bụ ndị ọrụ. Nna nna ya bụ onye Lozi si na obodo Barotseland, ebe ndị nne ya si obodo Mozambique. Nke a mere ka ezinụlọ ya nwee mgbagwoju anya: "Enwere m njirimara mba ụwa atọ, dị ka odi, o siri ike ịkọwa. " [2] Dị ka ọteghi aka na agụmakwụkwọ ya, ọ bụ onye edemede na-akụzi onwe ya nke na-agụkarị akwụkwọ.

Ọrụ ide ihe

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ ezie na o biri ndụ dị mkpirikpi, Zhuwao bụ onye edemede mara mma. E bipụtara ya n'ọtụtụ magazin ndị mba South Africa dị ka Bliksem, Contrast, New Coin, Staffrider, ma mee ka ya na onye na-ebipụta akwụkwọ, Robert Berold, bụrụ enyi, onye nyere aka nke ukwuu n'ihe nketa ya mgbe ọ nwụsịrị.[3][4] Nanị akwụkwọ o bipụtara, 'Sunrise Poison', nke e dechara n'afọ 1996, ka e wepụtara naanị afọ 21 mgbe ọ nwụsịrị.[5][6] Ọ bụ nke mbụ n'ime akwụkwọ anọ a haziri ahazi, nke gụnyere akụkọ ifo, edemede, akwụkwọ ozi yana uri.

A na-egosikwa ọrụ Zhuwao na 'Gary Cummiskey's Dye Hard Press' . [7] O dere usoro uri ya na onye na-ede uri South Afrịka ana akpo Alan Finlay.[8]

Akwụkwọ ndị e bipụtara

[dezie | dezie ebe o si]

Ọwụwa Anyanwụ (Deep South, 2018) [9]

The Red Laughter of Guns in Green Summer Rain: Chainpoems na Alan Finlay (Dye Hard Press, 2002)

Ebensidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. The Poetry of Phillip Zhuwao (poet) - Zimbabwe - Poetry International. www.poetryinternational.org. Retrieved on 2021-08-11.
  2. Phillip Zhuwao (poet) - Zimbabwe - Poetry International. www.poetryinternational.org. Retrieved on 2021-08-11.
  3. Sole (1996). "Bird Hearts Taking Wing: Trends in Contemporary South African Poetry Written in English". World Literature Today 70 (1): 25–31. DOI:10.2307/40151848. ISSN 0196-3570. 
  4. blank verse in freedom's thinking (en). skindeepmag.com. Retrieved on 2021-08-11.
  5. Where will all my nothing go? — Selves: An Afro Anthology of Creative Nonfiction curated by Basit Jamiu (en). OkayAfrica (2018-12-13). Retrieved on 2021-08-11.
  6. Phillip (2018-11-05). Sunrise Poison (in en). Deep South. ISBN 978-0-9947104-2-0. 
  7. Bofelo (2014-09-12). The Weekly Dissident: Gary Cummiskey, a Dadaist, surrealist, "madhouse screamer" (en-US). The Daily Vox. Archived from the original on 2021-08-11. Retrieved on 2021-08-11.
  8. Enough of an Interruption (en-US). The Common (2012-10-05). Retrieved on 2021-08-11.
  9. African Books Collective: Sunrise Poison. www.africanbookscollective.com. Retrieved on 2021-08-11.