Pyramids nke mkpụrụ osisi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Pyramids nke ala nut na Kano, Nigeria

Pyramids nke ala bụ ihe owuwu yiri pyramid nke e ji akpa ala mee. A rụrụ pyramids n'obodo ndị ugwu na Naijiria dị ka Kano, ebe mmepụta mkpụrụ osisi bụ akụkụ dị mkpa nke akụ na ụba. A na-ele ha anya dị ka ihe na'adọta ndị njem nleta na ihe nnọchianya nke akụ na ụba. N'afọ ndị 1960 na 70, ka mmepụta na Naịjirịa gbanwere site n'ọrụ ugbo gaa na mmanụ, pyramids nke okpekere lara n"iyi. N'oge na-adịbeghị anya, gọọmentị Naijiria gbaliri ike aka ha iji mee ka ụlọ ọrụ okpekere dị ndụ ma ruzie pyramids.[1][2]

Pyramids okpekere bụ ihe Alhassan Dantata mepụtara, onye a ma ama na-ere ahịa okpekere. Dantata bịara Kano na 1919 ma n'ime afọ ise ọ bụ otu n"ime ndị mere ofuma na azụmahịa a, na-enyekwa Royal Niger Company (RNC) ọtụtụ okpekere ha na-eme . Ụlọ ọrụ Dantata debere mkpụrụ osisi ha n'otu ụlọ ọrụ dị na Kofar Nassarawa, ha wee kwa kote akpa ndị ahụ n"ụdị pyramid tupu ebufee ha.[3] Enwere ike iji ihe ruru akpa okpekere 15,000 mee otu pyramid.[3] Otu onye nta akụkọ nke gara ebe pyramid nke dị na Kano kọrọ na ala ahụ bụzi ogige bọọlụ.[4]

Ha rụrụ pyramids n'ala ndi ugwu na Naịjirịa, n"obodo ndị dị ka Kofar Mazugal, Brigade, Bebeji, Malam Madori na Dawakin Kudu.[5] Pyramids bịa ziri dizie ka akụ na ụba ọrụ ugbo nke Naijiria; wee bụ na stampụ post gosipụtara pyramid okpekere.[3] Otú ọ dị, ka mmepụta okpekere na-ebelata na 1970s na 80s pyramids okpekere ndụ na'efu ejiri ụlọ dochie ya.[1]

Mgbalị nke Oge A[dezie | dezie ebe o si]

Na Febụwarị 24, 2014, Dr. Akimwumi Adesina, Minista nke Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo malitere ọrụ ọnụ ahịa okpekere. Ọrụ a bụ njikọ aka n'etiti Gọọmentị Federal (FG) nke Naijiria na International Crops Research Institute for the Semi-Arid Tropics (ICRISAT). Ebumnuche ha dị n'ụzọ abụọ: ịme ka mmepụta okpekere n'eto na Naịjirịa ma n'eruzi pyramid okpekere a[6] Onye isi ala Goodluck Jonathan kwughachiri mmasị gọọmentị iruharia pyramids n'okwu ngọzi nke àkwà mmiri na Machị 2015.[7]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Nnabuife. As FG moves to revive groundnut pyramids. Nigerian Tribune. Archived from the original on May 19, 2014. Retrieved on May 19, 2014.
  2. The forgotten groundnut pyramids of Nigeria, the one-time pride of the West African nation (en). Face2Face Africa (2019-01-06). Retrieved on 2021-06-26.
  3. 3.0 3.1 3.2 Sina Fadare. Kano: A long dream to bring back the groundnut pyramids. National Mirror. Archived from the original on May 20, 2014. Retrieved on May 19, 2014.
  4. Ismail. 60 Years After, Kano Groundnut Pyramids Site Turns to Football Field. Daily Trust. Archived from the original on 18 April 2017. Retrieved on 17 April 2017.
  5. Bashir. Groundnut Pyramids: Lost pride of the North. Freedom Radio. Archived from the original on May 20, 2014. Retrieved on May 19, 2014.
  6. Salu. Nigeria's Groundnut Pyramids soon to resurface. Akimwumi Adesina, Nigerian Minister of Agriculture spearheads revival. Retrieved on May 19, 2014.
  7. Abubakar. Jonathan In Kano, Promises Return Of Groundnut Pyramids. The Guardian. Retrieved on 9 June 2015.