R.A Rugged man

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
R.A Rugged man
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereR. Dezie
aha pseudonymCrustified Dibbs, R.A. the Rugged Man Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Jenụwarị 1974 Dezie
Ebe ọmụmụLong Island Dezie
Ọrụ ọ na-arụrapper, onye na-emeputa ihe ndeko Dezie
ebe agụmakwụkwọWard Melville High School Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1992 Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
diskografiR.A. the Rugged Man discography Dezie
ebe e guzobereLong Island Dezie
akara ndekọJive Records Dezie
webụsaịtịhttp://www.ratheruggedman.com/ Dezie

Àtụ:Infobox musical artist R.A Thorburn onye amụrụ na Jenụwarị 10, 1974,eji aha nkwago bụ R.A the Rugged Man mara ya. Ọ bụ onye Amerịka na- agụ egwu rap ma n'arụpụtakwa egwu. [1] Ọ malitere ọrụ egwu ya mgbe ọ dị afọ iri na abụọ,site n'iwuli nka ọ nwere n'egwu na mpaghara ụlọ. Thorburn bịanyere aka na aJive Records bụ egwu nke gbagotara mgbe ọ dị afọ iri na asatọ mana ewepụtaghị efere egwu ya nke mbụ bụ Night of the Bloody Apes . [2]

R.A Rugged man

Kemgbe ahụ ọ rụrụ na nkwado nke Mobb Deep, Wu-Tang Clan, Kool G Rap, and Notorious B.I.G., gbakwunyere ndị mmepụta egwu dị ka Erick Sermon, Trackmasters, DJ Quik, The Alchemist, J-Zone, and Ayatollah. Ọ pụtara na albọm atọ niile kpụ ọkụ n'ọnụ nke Rawkus gbakwunyere nrepu otu ma ọ bụ abụọ nke albọm WWF Aggression .Ka otuCapitol Records weturu obere ezumike( nke ọ nwere ohere ya dekọ albọm n'ewepụtaghị bụ, American Lowlife), Thorburn bịanyere aka nkwekọrị́ta na labeelụ nọọrọ onwe ya bụ Nature Sounds ma wepụta ọrụ mbụ ya bụ, Die, Rugged Man, Die. Na 2013, Thorburn wepụtara albọm nke abụọ bụ, Legends Never Die, site n'aka ọrụ Nature Sounds.[3]

Na mgbakwunye na ọrụ hip họp ya, Thorburn nọ na-arụsi ọrụ ike dị ka onye na-ekwu okwu njikwa egwuregwu ịkụ ọkpọ na onye na-enyocha ihe nkiri.  O nyela aka na <i id="mwMQ">Vibe</i>, <i id="mwMw">King</i>, <i id="mwNQ">Complex</i>, Rides, XXL, The Source, The Ring na ndị ọzọ. O dere ma mepụta ihe nkiri otu nzuzo Bad Biology, ma na-akwadokwa websaịtị "Film School" na MTV 's Film.com.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

1992 ruo 2003: Mmalite[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 1992, Thorburn sonyere Jive Records, n’ime etiti afọ ndị 1990,O binyere aka na priority Records / EMI . [4] Omechara nwee nkwekọrịta njikọ ya na Capitol Records mana ọ malitere ndekọ onwe ya na mmalite 2000. Ya na ndị MC rụkọrọ ọrụ bụ ndị dịka The Notorious B.I.G, Mobb Deep, na Chuck D.  Ọ pụtara na albọm atọ niile kpụ ọkụ n'ọnụ nke Rawkus, gbakwunyere nrepu otu nde ma ọ bụ abụọ nke WWF Aggression,n'emere Chris Jericho isi egwu. N'egwu<i id="mwVg">Ego Trip</i> olu nke mbụ,Ishu nke atọ, The Notorious B.I.G kwuru na-asị, "Echere m na m bụ onye ka ịdị njọ," mgbe ọ na-ekwu maka Thorburn. [5]

2004–2012: Egwu Rugged man Nwụ anwụ, n'egosipụta n'obere ihe nkiri na ederede magazin[dezie | dezie ebe o si]

na 2004, Thorburn wepụtara albọm mbụ ya bụ Die, Rugged Man, Die site na akara ngosi sitere na Brooklyn Nature Sounds . O nweela ọtụtụ vidiyo vgụnyere Havoc si Mobb Deep I am the Boss, Sadat X ' Throw the Ball na Masta Killa ' Old Man na- egosi RZA na Ol' Dirty Bastard .

Íshuu Ọktoba 2006 nke The Sourcegosipụtara amaokwu Thorburn naUncommon Valor: A Vietnam Story dị ka "Hịp-họp ọ kwoturu" nke ọnwa ahụ  na HipHopDX agụrụ aha dị ka "Amaokwu nke Afọ". [6] AllHipHop.com na-ekwu na "A ga-echeta ndekọ a maka akparamagwa robot nke R.A na-akọ akụkọ nna ya n'agha mgbe ọ n'akụpụ nkwa."  Mgbe a na-enyocha egwu ya "On the Block", Vibe Magazine kwuru, "Ahụrụ m egwu a n'anya. Ọ na-awụm akpatoyi. Ọ bụ nnọọ nchepụte echepụtara nke ọma " 

N'ịgbakwunye na ọrụ hip hop ya, Thorburn dere otu kọlụm ihe nkiri kwa ọnwa maka akwụkwọ Mass Apppeal Magazine , bụ onye na-enye aka na akwụkwọ ndétu rap Ego Trip na(N'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ St Martin ) na akwụkwọ gbasara ikpaoke agbụrụ nke Ego Trip nke(HarperCollins), ma dee ọtụtụ isiokwu maka akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ gụnyere <i id="mwew">Vibe</i>, <i id="mwfQ">King</i>, <i id="mwfw">Complex</i>, Rides, XXL na The Source

Dị ka onye ihe nkiri na-atụ ụjọ masiri, Thorburn edeela ihe ngosi atọ gbakwunyere onye nduzi ihe nkiri Frank Henenlotter bụ odee na onye mmepụta ihe nkiri Henenlotter Bad Biology . Ihe nkiri a nwere akara mbụ site n'aka Josh Glazer(J.Glaze )tinyere mmepụta nke Prince Paul, na obere ihe ngosi nke onye ejiji nlereanya Playboy bụ Jelena Jensen na Pentihaụs peetibụ Krista Ayne. Thorburn na-arụ ọrụ ntuziaka mbụ ya, ihe nkiri sitere gbasatara ezinụlọ ya, Chineke Were, Chineke Nye . [7]

2013 – ugbu a: Asị dike anaghị anwụ anwụ ma ndị bụ dikem niile anwụchala[dezie | dezie ebe o si]

Performing in 2013

Ewepụtara albọm studịo nke abụọ nke Thorburn bụ Legends Never Die n'abalị iri atọ n'ọnwa Eprel,2013  Ndị ọbịa gosipụtara na ya bụ Brother Ali, Masta Ace, Tech N9ne, Talib Kweli, Hopsin, Eamon, and Krizz Kaliko. Sịngụl ya nke mbụ na albọm a bụ"The Peoples Champ", nke abụọ bụ "Learn Truth" feat. Talib Kweli. Upon release the album debuted at number 1 on the US Billboard Ka ewepụtara albọm a, ọ gbara dịka nke mbụ n'ọnụ ọgụgụ na igbe ịma ọkwa nke US nke Heatseekers Albums chart, ma bụrụ nke iri na asaa na isi igbe ịma ọkwa nke Top R&B/Hip-Hop Albums chart, ma nọrọ na nke otu narị na iri atọ na otu na <i id="mwqg">Billboard</i> 200.[8] N'afọ 2016, onye rap German bụ Kool Saves gosipụtara Thornburg na albọm studịo bụ Essahdamus n'egwu akpọrọ "Wahre Liebe".

Ewepụtara albọm nke atọ nkeThorbun, All My Heroes Are Dead, na Eprel 17, 2020. O gosipụtara ndị nka dịka Ghostface Killah, Eamon, Atmosphere, Ice-T, Vinnie Paz, Brand Nubian, Chino XL, MOP na Onyx . [9]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Nna Thorburn, Staff Sgt. John A. Thorburn, bụ onye agha Vietnam nke Agent Orange metụtara.  nne-ya nwoke Maxx mụrụ nwere nkwarụ ma kpuo ìsì, ma nwụọ mgbe ọ dị afọ iri.Nwanne Thorburn nke nwanyị, Dee Ann, nwụrụ n'afọ 2007 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na isii. Thorburn kọrọ akụkọ nna ya na " Uncommon Valor: A Vietnam Story ," site na albọm Jedi Mind Tricks :Servants in Heaven, Kings in Hell . John A. Thorburn nwụrụ na Jenụwarị 7 2010 maka ọrịa kansa. [10] Thorburn sitere na German, Scottish na agbụrụ Sicilian. [11]

Thorburn nwere ụmụ abụọ: Ella (amụrụ na 2016) na John A. Thorburn (amụrụ na 2017).

Nghọta Egwu ya[dezie | dezie ebe o si]

Albọm ọrụ Studịo
  • 2004: Die, Rugged Man, Die
  • 2013: Legends Never Die
  • 2020: All My Heroes Are Dead
Albọm achịkọtara
  • 2009: Legendary Classics Vol 1
Albọm a na-ewepụtaghị
  • 1994: Night of the Bloody Apes
  • 1999: American Lowlife 
EP
  • 1998: Poor People 
Ngwakọta
  • 2007 Ruff Rugged & Raw 
  • 2010 Crazy Man (The Best, The Forgotten & The Worst) 
  • 2011 Murderous Verses 

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri
Afọ Gosi Ọrụ Ihe edeturu
2008 Icemụ Atọ Atọ Nnukwu (Short)
2008 Ọgwụ Ọjọọ Ex-Boyfriend (dị ka RA onye a dọgburu onwe ya) Ọzọkwa onye edemede na onye mmeputa
2009 Mbibi Ndi oru ihe nlere ndi mmadu # 1 (Short)
2013 Skid Ahịrị Jọn

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. R.A. The Rugged Man. Nature-sounds.net. Retrieved on 2011-05-30.
  2. Ben Westhoff (10 November 2009). R.A. the Rugged Man Abides. Archived from the original on 30 October 2014. Retrieved on 9 March 2015.
  3. Jeremiah. R.A. The Rugged Man: The People's Champ [prod by Apathy - KevinNottingham.com]. KevinNottingham.com. Archived from the original on 7 November 2017. Retrieved on 9 March 2015.
  4. Hakes, Tyler (3 March 2011). R.A. The Rugged Man Releases Video Based On Experience With Jive Records. aboveGround Media. Archived from the original on 19 February 2013. Retrieved on 24 July 2013.
  5. R.A. the Rugged Man Abides – Page 1 – Music – New York. Village Voice (2009-11-10). Retrieved on 2011-05-30.
  6. Hale, Andreas. (2007-01-01) 2006 HipHopDX Awards | Rappers Talk Hip Hop Beef & Old School Hip Hop. HipHop DX. Retrieved on 2011-05-30.
  7. R.A. The Rugged Man Talks New Film And Music Projects. (2009-08-31). Retrieved on 2013-04-17.
  8. LL Cool J Scores 13th Top 10 on Top R&B/Hip-Hop Albums. Billboard. Retrieved on May 30, 2013.
  9. R.A. the Rugged Man - All My Heroes Are Dead. musicmeter. Retrieved on April 25, 2020.
  10. Hip Hop Underground bio on R.A. The Rugged Man describes the tragic death of is family members
  11. HipHopDX (18 October 2013). R.A. The Rugged Man Says Justin Timberlake Is "Not The Epitome Of Talent". HipHopDX. Retrieved on 9 March 2015.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Official website