Rachel Wolfe-Goldsmith
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Jenụwarị 1991 |
ọrụ ọ na-arụ | contemporary artist |
webụsaịtị | https://www.rachelwolfegoldsmith.com/ |
Rachel Wolfe-Goldsmith (amụrụ na úbọchị irí nà atọ n'ọnwa Jenụwarị, 1991) bụ ónyé America na-ese ihe nke bi na Oakland, California.[1] A maara ya màkà nnukwu mgbidi ya, ọ bụkwa ónyé nduzi okike nke Bay Area Mural Program.[2]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]N'oge opupu ihe ubi na ógè okpomọkụ nke afọ 2020, mgbè ogbugbu George Floyd gasịrị, Wolfe-Goldsmith so n'ọtụtụ ndị na-ese ihe na-ese mgbidi na nzaghachi màkà ogbugbu ahụ na iberibe osisi na-ekpuchi ụlọ ahịa na etiti obodo Oakland. A na-akpọ akụkụ ya na 15th St. We Can Breathe .[3] N'oge a, Bay Area Mural Program, na Wolfe-Goldsmith dị ka ónyé nduzi okike, na African American Arts & Culture Complex haziri Black Lives Matter mural na San Francisco, nke gbara màkà mpaghara ọbọdọ atọ.[2][4]
Otu She Will Rise, nke na-arụ ọrụ iji nweta nwanyị ojii na Ụlọikpe Kasị Elu nke United States, nyèrè Wolfe-Goldsmith ọrụ ise ihe osise na Washington, DC. Emechara ya n'ọnwa Ọktoba 2020, ọrụ ahụ gosipụtara ndị ọka ikpe na ndị na-eme ngagharị iwe nke ụmụ nwanyị ojii.[5]
N'ọnwa Nọvemba 2020, a màrà ọkwa na Wolfe-Goldsmith ga-ese ihe osise na-elekwasị ányà na ikpe ziri ezi nke ọha na eze na onye ọrụ ibe ya Joshua Mays. Kaiser Permanente na ABG Art Group nyere iwu ka e see ihe osise ahụ, ma gosipụta ya n'èzí ọfịs Kaiser na etiti ọbọdọ Oakland tupu a mee atụmatụ ịkwaga Liberation Park.[6] Ọzọkwa n'etiti obodo Oakland, Wolfe-Goldsmith eseela ihe osise atọ nke ónyé na-ese ihe Stoney Creation na ihe nlereanya Yanni Brump.[7]
N'ọnwa Febụwarị 2021, ónyé nwe ụlọ na onye nlekọta nke West Oakland bụ Jilchristina Vest nyèrè Wolfe-Goldsmith iwu ka ọ see ihe osise nke ụmụ nwanyị na Black Panther Party n'akụkụ ụlọ ya na Center na 9th Streets.[8] Ihe osise irí atọ nke ụkwụ dabeere na ọtụtụ foto Stephen Shames sere ma gosipụta Delores Henderson, Angie Johnson, Lauren Williams, na nwa nwanyị Williams Mary. Ihe osise ahụ ugbu a gosipụtara aha ihe karịrị ụmụ nwanyị narị atọ, a na-eme atụmatụ na ọ ga-abụ square mita Puku abụọ mgbe emechara ya. A gwara ónyé isi Black Panther Ericka Huggins màkà ọrụ ahụ.[9][10][11][12][13]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Rachel Wolfe-Goldsmith An American Artist. bcx.news.
- ↑ 2.0 2.1 McLean. "Black Lives Matter mural spans 3 blocks in San Francisco", SF Gate, June 12, 2020.
- ↑ Brady (July 25, 2020). What is the fate of Black Lives Matter protest murals?. Salon.
- ↑ James. "Bay Area Change Agents", Nob Hill Gazette, July 11, 2020.
- ↑ Barber. "PHOTOS: Mural painted in Shaw pushes for more women of color in the Supreme Court", ABC7, October 25, 2020.
- ↑ Burbank. "Big Mural Being Created To Support Social Justice Efforts", SF Gate, November 6, 2020.
- ↑ Harshaw. "Yanni Will Eat You Up and Make You Love Yourself", KQED, October 9, 2020.
- ↑ Black Panther Party women honored in West Oakland mural by Rachel Wolfe-Goldsmith (en-US). The Mercury News (2021-02-13). Retrieved on 2021-06-29.
- ↑ Nzinga. "‘A mural that celebrates Black joy’: Oakland home honors women of the Black Panther party", The Guardian, February 28, 2021.
- ↑ Toussaint (2021-06-16). A new exhibit honoring the Black Panther Party is opening in Oakland on Juneteenth (en). AL DÍA News. Archived from the original on 2021-06-29. Retrieved on 2021-06-29.
- ↑ Black Panther Party museum to open on Juneteenth (en-US). TheGrio (2021-06-13). Retrieved on 2021-06-29.
- ↑ Oakland (2021-02-28). ‘A mural that celebrates Black joy’: Oakland home honors women of the Black Panther party (en). the Guardian. Retrieved on 2021-06-29.
- ↑ Aaron (2021-02-26). West Oakland mural first to honor women of the Black Panther Party (en). ABC7 San Francisco. Retrieved on 2021-06-29.