Jump to content

Rachid Koraïchi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Rachid Koraïchi (Arabic: رشيد قريشي[1]) bu onye eserese, okpukpu osisi, mbiputa na okpu ite nke Ọjiriais a mara maka ọrụ ǹkà ya nke oge ugbua which integrates calligraphy as a graphic element.

Ndụ ma Ọru

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Rachid Koraïchi na ubochi iri abuo na onwa Jenụwarị 1947 na Ain Beida, Algeria n'ime ezinụlọ Sufi nke ndị ọkà mmụta Qu'ranic na ndị na-edepụtaghachi.[2] Ọ natara agụmakwụkwọ nka ya na École des Beaux-Arts na Algeria, ebe ọ gụrụ calligraphy. Mgbe e mesịrị, ọ gara École des Arts Décoratifs na École des Beaux-Arts na Paris.

Ọzụzụ ya na ndị Sufi emetụtala ọtụtụ n'ime ọrụ ya site n'inye ya mmasị na edemede na akara. Maka Koraïchi, ide ihe dị nsọ ma nwee ihe ọ pụtara. Ọrụ ya na-eji calligraphy Arabic eme ihe nke ukwuu yana glyphs sitere na asụsụ ndị ọzọ.[3]

Ọ mepụtara ọrụ na midia dị iche iche nke sinyere ịkpụ ite, akwa ntinye ǹkà nkà igwe,iteagba, na ime mbiputa, ma na eso nye kwa ndi nka ukporo na ọrụ ha.

E gosipụtara ọrụ ya n'ọtụtụ ebe, gụnyere na Venice Biennale (2001) [4] na MOMA (2006), [5] ma dịkwa na nchịkọta nke Ebe nkiri mba nke nka Afrịka, Washington D.C.

Ihe ngosi ndị a họọrọ

  • 1998 Jardin du Paradis, Ememme Mba Nile nke Ogige. Chaumont-sur-loire Leighton House, London
  • 1999 Global Conceptualism: Points of Origin, 1950s-1980s, Queens Museum of Art, New York.
  • 1999-2000 Akwụkwọ ozi ụrọ, Ebe Ngosi Ihe Ochie, Caracas, Venezuela, Limoges na Algeria
  • 2000 L'Enfant Jazz, Institut de monde arabe, Paris, France
  • 2001 Beirut's Poem and Path of Roses, National Gallery of Fine Art, Amman, Jordan.
  • 2002 Rachid Koraïchi: 7 Variations autour de l'Indigo, Marseille, Vieille Charit et Alors Hors Du Temps.

Ebe mụ si dee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. "حديقة إفريقيا" مقبرة للمهاجرين من ضحايا ركوب البحر في تونس - فرانس 24 (ar). فرانس 24 / France 24 (2021-06-09). Retrieved on 2022-03-29.
  2. Cotter. "Rachid Koraichi, Making His Own Language", The New York Times, 2016-03-31. Retrieved on 2023-01-31. (in en-US)
  3. Rachid Koraichi. www.encyclopedia.mathaf.org.qa. Retrieved on 2023-01-31.
  4. FindArticles.com | CBSi. www.findarticles.com. Retrieved on 2018-02-05.
  5. Without Boundary: Seventeen Ways of Looking (2006 exhibition), MOMA