Ramatu Tijjani Aliyu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ramatu Tijjani Aliyu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Jụn 1970 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Kogi Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of State for Federal Capital Territory Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie

Ramatu Tijjani Aliyu (a mụrụ na 12 Juun 1970) bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa si steetị Kogi. Ọ bụ onye Minịsta FCT nke onye isi ala Nigeria, Muhammadu Buhari, họpụtara na August 21, 2019[1]. Tupu ọ bụrụ minista, ọ jere ozi dika onye isi ụmụnwaanyị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Nigeria Peoples Party (ANPP) na All Progressive Congress (APC)

Mmalite ndụ ya na ezinụlọ ya[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Ramatu na Wuse, Abuja, Naijiria[2][3]. Ọ bụ nwa late Alhaji Mamman Sidi Ali bụbụ onye isi mba Lokoja na steetị Kogi. Ramata gara awkwukwo na Dawaki Primary school dị na Suleja site na 1976 ruo 1982 na Federal government college (FGC) Minna, Niger steetị ebe ọ gusịrị na 1988. N'afo 1990, ọ banyere mahadum Ahmadu Bello Zaria ebe ọ gụrụ Urban and Regional Planning. Ka ọ gusiri na 1995, o jere ịweta nzere mastas na mahadum Nasarawa Steetị dị na Keffi.

Ọrụ na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ramatu maliịtere ịrụ ọrụ mgbe o mechara National Youth Service Corps (NYSC) ya na ụlọ ọrụ nke Federal ministry works and housing. ọ banyere AZAH Intermediaries Nigeria Limited, ndi sịvịl injinịa ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi njikwa mana o mechara laghachi mahadum ebe ọ mere nzere mastas ya ma nata Asambodo ya na ihe gbasara ịduzi ndị Isi.

N'afo 2004, onye isi oche ndi Gwagwalada nọ FCT, Abuja họpụtara Ramatu dika onye ndụmodụ gbasara ihe ụmụ nwaanyị, ndị ntọrobia na oganihụ obodo. Na 2007, ọ gbara mbo ibanye ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka ịnọchite anya ndị mba Kwali / Abaji na ndị nnọchi anya ụlọ nke Naijiria (NASS) mana onweghị isi, mana na 2008, emere ya onye isi oche nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya nke bụ All Nigeria Peoples Party (ANPP) nke o jere ozi dika onye nlekọta North Central Zone.

N'afo 2010, enyere ya okwa dika onye isi ụmụ nwaanyị otu ha na onye isi ala Council of African Political Parties (CAPP). Na 2014, emere ya onye isi ụmụ nwaanyị na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a guzobere ọhụrụ bụ All Progressives Congress (APC) ebe o jere ozi ruo 2018[4].

Ndụ ya nime[dezie | dezie ebe o si]

Di Ramatu bụ Alhaji Ahmed Tijjani Aliyu, onye na-arụ ọrụ n'ụlọ akụ na ndị na-enyere ndị mmadụ aka. Ha mụrụ ụmụ atọ.

Ramatu na-arụ ọrụ na NGO ma guzobe Global Women and Youth Empowerment Strategy (GLOWYES)[5].

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Buhari List minister portfolios. Pulse Nigeria.
  2. Amuda Dan Sulaiman F A-B (23 July 2019). The Outstanding-profile of Hajiya Dr Ramatu Tijjani Aliyu ministarial nominee-from Kogi State. Kogi Watch NG. Archived from the original on 14 August 2019. Retrieved on 4 August 2019.
  3. Know the Pedigrees of Buhari's New Ministers. PM News Nigeria (30 July 2019). Retrieved on 4 August 2019.
  4. Amuda Dan Sulaiman F A-B (23 July 2019). The Outstanding-profile of Hajiya Dr Ramatu Tijjani Aliyu ministarial nominee-from Kogi State. Kogi Watch NG. Archived from the original on 14 August 2019. Retrieved on 4 August 2019.
  5. Amuda Dan Sulaiman F A-B (23 July 2019). The Outstanding-profile of Hajiya Dr Ramatu Tijjani Aliyu ministarial nominee-from Kogi State. Kogi Watch NG. Archived from the original on 14 August 2019. Retrieved on 4 August 2019.