Razan Naiem Almoghrabi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Razan Naiem Almoghrabi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịLibya Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1961 Dezie
Ebe ọmụmụDamascus Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, women's rights activist Dezie

Razan Naiem Almoghrabi (Arabic), nke a na-ahụkwa dị ka Razan Naim Moghrabi, bụ onye edemede na onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị na Libya.[1]

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Razan Naiem Almoghrabi gụrụ akwụkwọ ndekọ ego tupu ọ buruzie onye na ede akwụkwọ akụkọ .[2]

Akụkọ maka Ọrụ ya.[dezie | dezie ebe o si]

Almoghrabi anọwo na-ebipụta ọrụ ya na akwụkwọ akụkọ Libya kemgbe 1991 ma bụrụ onye nchịkọta akụkọ maka magazin ọdịnala a na-akpọ Horizons.[3] Ọrụ ya bipụtara gụnyere ọtụtụ nchịkọta akụkọ dị mkpirikpi, n'etiti ha In Exile and Horses Devour the Sea (2002), Texts with a Lost Signature (2006), An In-between Man (2010), na Soul for Sale (2010); akwụkwọ akụkọ abụọ (Migration to the Tropic of Capricorn na 2004 na Women of Wind na 2010) na otu mpịakọta nke uri.[2]

Akwụkwọ akụkọ ya bụ Women of Wind (Nisa al rih), nke otu onye Moroccan na-eje ozi na Tripoli na-achọ onye na-ebubata ihe iji hazie njem ya na Europe, edepụtara maka Arabic Booker Prize (International Prize for Arabic Fiction) na 2011. N'afọ 2015, e nyere Almoghrabi onyinye Oxfam Novib / PEN maka mbọ ọ na-agba iwetara ndi ode akwukwọ akụkọ mmeri nakwa ndị nta akụkọ na Libya.[4]

Almoghrabi haziri nzukọ mbụ nke umunwanyi mere maka inweta ikikere nke ha na afo 2012 ma bịanyekwa aka na ikwupụta idinaotu ụmụ nwanyị nke Syria, na Forum on Women's Rights, Peace and Security na Istanbul.[5] N'afọ 2013 ọ kwuru okwu n'ihu Kọmitii Mba Ndị Dị n'Otu na Ọnọdụ Ụmụ nwanyị banyere ikike ụmụ nwanyị na Libya. Nkwado ụmụ nwanyị ya n'ihu ọha, gụnyere nhọrọ ya ịghara iyi ákwà mkpuchi, emeela ka ọ bụrụ onye ana atụ aka inwu ọnwụ bịakwa bụrụ onye ana ahuta ka onye na ebute ogbaaghara na Okpụkpere Chi, na afo 2013 na ihu ụlọ ya ka agbara ọtụtụ egbe nke ndị gbara egbe a bu ndi otu soja.[6][7]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Author profile on IPAF website. Archived from the original on 2016-03-03. Retrieved on 2023-07-15.
  2. 2.0 2.1 Razan Naim Moghrabi, Banipal Magazine of Modern Arab Literature, author page.
  3. Fatima El Issawi, "Women and Media: Libyan Female Journalists from Gaddafi Media to Post- revolution: Case Study" Cyber-Orient 8(1)(2014).
  4. Pen International, "Oxfam Novib/PEN Awards 2015".
  5. Statement of Solidarity, Om Kvinna till Kvinna (1 October 2012).
  6. "Razan al-Maghrabi", participant profile, Writers Unlimited International Festival Winternachten the Hague.
  7. Lisa Anderson, "Women's Rights Under Growing Pressure in Arab World" Thompson Reuters Foundation News (7 March 2013).

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]