Rifkatu Adamu Chidawa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rifkatu Adamu Chidawa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụȮra Niger Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Rifkatu Adamu Chidawa (amuru 18 Febrụwarị 1956) bu Kọmishọna na-ahụ maka njem nlegharị anya na omenala, Naija Steeti, Naijiria. [1] [2] [3]

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Chidawa na 18 Febrụwarị 1956 na Diko na Gọọmentị Ime Obodo nke Gurara di na Naija Steeti.[1]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Chidawa malitere ụlọ akwụkwọ praịmarị n'ọnwa Jenụarị n'afọ 1962, wee gaa ụlọ akwụkwọ Gọọmenti Ụmụ nwanyị nke Sekọndrị, Minna. O mechara nweta Asambodo Mmụta Mba n'afọ 1981. E zigara Chidawa na Ulo Akwụkwọ Sekọndrị Gọọmentị Nke Ụtụtụ dI na Suleja, Naija Steeti maka otu afọ Ọrụ Ntorobịa nke Mba na 1981. Ọ nwetara asambodo mbụ ya na agụmakwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello . O mechara gaa mahadum Abuja n'afọ 1999 maka ogo masta na nchịkwa agụmakwụkwọ na nhazi. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Chidawa malitere ọrụ ya dịka onye nkuzi. Ọ dubere ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị iche iche na Abuja na Niger steeti. [1] Mgbe e mesịrị, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Kọmishọna na-ahụ maka njem nlegharị anya na omenala. [1] Chidawa bidoro mmemme iji nyochaa ọrịa kansa na Gọọmenti Ime Obodo nke Gurara dị na steeti Niger. [4]

Ndụ Nkeonwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụọla di, ma nweekwa ụmụ. [1]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Chukwudiebere (2019-10-31). Twenty Commissioners join Niger State Executive Council (en-US). Voice of Nigeria. Archived from the original on 2019-11-01. Retrieved on 2020-11-19.
  2. Minna (2020-06-29). Niger targets increased IGR from tourism (en). Daily Trust. Retrieved on 2020-11-19.
  3. Admins (2019-10-30). ‘No first-class commissioners’ in my cabinet, says Sani-Bello (en-US). Newsdiaryonline Nigeria. Retrieved on 2020-11-19.
  4. Asishana (2020-10-26). Rural Women In Gurara Receive Free Cancer Screening (en-US). Transcontinental Times. Retrieved on 2020-11-19.