Right to a healthy environment in Tunisia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ugbo ifufe na Tunisia

"Iwu nke gburugburu ebe obibi dị mma" na Tunisia bukwa ikike mmadụ nke Iwu Tunisia nke 2014 kwadoro kamakwa iwu ndị ọzọ na mgbakọ mba ụwa.[1]

Usoro iwu[dezie | dezie ebe o si]

Iwu Tunisia[dezie | dezie ebe o si]

Iwu Tunisia nke afọ 2014 kwadoro ikike maka gburugburu ebe obibi dị mma na Tunisia, ọkachasị site na isiokwu nke irí anọ ná isé nke kwuru nà: " Steeti na-ekwe nkwa ikike maka gburugburu ebe obibi dị mma na nke ziri ezi na ikike isonye na nchedo ihu igwe. Steeti ga-enye ụzọ dị mkpa iji kpochapụ mmetọ nke gburugburu ebe obibi. "

Isiokwu nke iri na abụọ sikwa n'otu iwu ahụ na-ekwukwa sí na steeti "ga-achọ inweta ikpe ziri ezi nke ọha na eze, mmepe na-aga n'ihu" na "iji akụ na ụba sị n'ime àlà eme ihe n'ụzọ kachasị mma".

Mgbakọ Mba Nile[dezie | dezie ebe o si]

Steeti nké Tunisia akwadola ọtụtụ nkwekọrịta na mba abụọ metụtara nchedo gburugburu ebe obibi na mgbochi mmetọ. N'ime mgbakọ ndị a:[2]

  • Nkwekọrịta Mba Ndị Dị n'Otu iji lụso Ọzara ọgụ nakweere na 17 June 1994 (nke iwu n°95-52 kwadoro na mpaghara na 19 June 1995) ;
  • Nkwekọrịta London banyere igbochi mmetọ mmiri site na ịwụfu ihe mkpofu na ihe ndị ọzọ nakweere na 29 Disemba 1972 (nke iwu n°76-17 kwadoro na mpaghara na 21 Jenụwarị 1976);
  • Nkwekọrịta Barcelona maka Nchedo nke Gburugburu Mmiri na Mpaghara Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian nakweere na 16 Febụwarị 1976 (nke iwu n°77-29 kwadoro na mpaghara na 25 Mee 1977 ma gbanwee ya site na iwu n°98-15 na 23 Febụwarị 1998).

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Social and ecological transformation in Morocco and across Africa. boell.org. Retrieved on 2021-05-27.
  2. Sources of environmental law in Tunisia. aihja.org. Archived from the original on 2018-07-13. Retrieved on 2021-05-27.