Jump to content

Ritah Namayanja Kivumbi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ritah Namayanja Kivumbi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie

 

Ritah Namayanja Kivumbi (amụrụ na Mee 1, 1980) nke a makwaara dị ka Ritah Wise, bụ nwanyị kpụrụ ịsị, onye na-ese ihe nkiri na ọkà okwu na-akpali akpali. Ọ bụ onye guzobere, na onye nduzi nka nke Magezi Arts Exhibition Centre nke dị ugbu a na Namirembe Guest House na Kampala. N'afọ 2016, Onye isi ala Museveni nyere Namayanja ihe nrite ọla edo nke onye isi ala na-asọpụrụ mbọ ọ na-agba iji nye ndị ntorobịa na ụmụ nwanyị ike.

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Namayanja gara Uganda Martyrs Senior School Namugongo (O-level) na Uganda Martyrs High School, Rubaga (A-level).[1]

Ọ sonyeere Mahadum Makerere ebe ọ gụsịrị akwụkwọ we nweta nzere bachelọ na Development Studies ma mesịa nweta nzere masta na Ethics and Public Management.[1]

N'ọnwa Nọvemba afọ 2008, Namayanja nwere isi ọwụwa siri ike ugboro ugboro ma bụrụ onye kpuru ìsì otu ọnwa ka e mesịrị, nke mere ka ọ daa n'ịda mbà n'obi na ọmịiko onwe ruo afọ asaa.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupu Namayanja ekpuo ìsì, ọ bụ onye nchịkwa nke Makerere University Art Gallery ma bụrụ onye haziri Magezi Art Exhibition na Septemba 2008.[2]

N'afọ 2008, obere oge tupu Namayinja ekpuo ìsì, o guzobere Magezi Arts Gallery, mana ọ dara n'oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị n'ihi na ọ dara n"ịda mbà n'obi na ọmịiko onwe mgbe ọ kpuru ìsì.

N'ọnwa Machị afọ 2015, ọ maliteghachiri ụlọ ngosi nka Magezi, nke na-arụ ọrụ nka dị iche iche ma na-azụkwa ụmụ akwụkwọ si n'ụlọ akwụkwọ dị iche iche.[3]

N'afọ 2016, n'ụbọchị ụmụ nwanyị, Onye isi ala Museveni nyere Namayanja ihe nrite ọla edo nke onye isi ala Museveni na-asọpụrụ mbọ ọ na-agba iji nye ndị ntorobịa na ụmụ nwanyị ike.[4]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Out of sight not out of mind: Woman's love for art lives on (en). Monitor (2020-07-21). Retrieved on 2022-03-27. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Jjingo. Blind Kivumbi's art and artistic children are a marvel (en-gb). The Observer - Uganda. Retrieved on 2022-03-27. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. Divine Wonders Sanyu: the poetess raised by a blind mother (en). Bukedde. Retrieved on 2022-03-27.
  4. Ritah Kivumbi sees beyond her visual impairment (en). New Vision. Retrieved on 2022-03-27.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]