Roost Foundation

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Roost Foundation

Roost Foundation bụ ọgbakọ na-abụghị nke gọọmentị nke dabere na Nigeria nwere isi ụlọ ọrụ na Abuja.

E guzobere nzukọ ahụ n'ebumnobi ịlụ ọgụ maka igbochie ịtụ mgbede mmadu na omume Mmekọahụ joro njoo nkee a na akpoo Sexual and Gender Based Voilence (SGBV).[1][2][3]

Atụmatụ[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka webụsaịtị ya si kwuo, ọrụ ha bụ "Igbochi na iwepụ ihe niile gbasara emume ịtụ mgbere mmadụ na Mmekọahụ ojoo kachasi umu nwaanyi na umuaka na Nigeria wee meziwanye ndụ nke ndị ahụ metụtara site n'inye enyemaka iwu na enyemaka mmadụ"[4]

Ebumnuche[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ịrụ ọrụ maka ihe gbasara nkwekọrịta mmadụ na ibe ya maka ndị aturụ mgbere (Trafficking In Persons (TIP)) na omume ojoo gbasara Mmekọahụ na umu nwaanyi (nke bu Sexual and Gender Based Violence (SGBV)) na Naijiria
  2. Isonye ma tinye aka na mmemme ahụike ọhanaeze na obodo.
  3. Inyere aka na usoro mmekọrịta mmadụ na ibe ya na mmezu onwe onye nke ndị TIP na SGBV metụtara.
  4. Ịkwado ikike mmadụ na ọkachasị ikike nke ndị TIP na SGBV metụtara ma kwalite ịha nhata nwoke na nwanyị.
  5. Igbaa ọrụ afọ ofufo ume ma mee ka amara maka ya.
  6. Iwere ikike nkwekọrịta mmadụ na ibe ya, agụmakwụkwọ na akụnụba nye ndị mmadụ na-adịghị ike iji gbochie TIP SGBV na mbugharị na-adịghị mma.
  7. Ichebe ikike nke ndị omume ojoo ahu metụtara ma dozie ọdịmma nke Ụmụaka nọ ná mkpa, ọkachasị, ụmụaka na-ahụ ụdị mmetọ ọ bụla, na ịtụ mgbere mmadụ.
  8. Ịgosi ndị o metụtara mmemme Gọọmenti dị iche iche, atụmatụ na usoro ọdịmma ma debanye ha n'otu.
  9. Ịgbasa ozi make itu mgbere mmadu na obodo nille, kachasị Ụmụ akwụkwọ, Ndị ọrụ na òtù ndị ọzọ.
  10. Inye enyemaka ahụike na enyemaka akwughi ego maka ndị TIP na SGBV metụtara.
  11. Inye nduzi na ndụmọdụ maka ndị TIP na SGBV metụtara.
  12. Imepụta nnukwu mkpọsa maka mmata banyere ihe ndụ nke mbugharị na-adịghị mma, nsogbu TIP na SGBV site n'ịgbasa ozi n'etiti ọhanaeze.
  13. Iguzobe ụlọ ọrụ redio iji kesaa ozi na TIP na SGBV site na mmemme, jingles wdg.
  14. Iji mee ihe ndị ọzọ dị otú ahụ ma nye ọrụ ma ọ bụ enyemaka gụnyere nguzobe nke ụlọ ọrụ ozi, ndokwa maka ụlọ obibi, ụlọ ọrụ nnweta nkà, ịmepụta ụlọ ọrụ agụmakwụkwọ, nyocha na ọzụzụ, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka emume Mmekọahụ ojoo wdg.
  15. Kpochapụ omenala na-emerụ ndi oha ahụ kachasi ụmụ nwanyị na ụmụaka.
  16. Ikwado iwu iji lụso ịtụ ahịa mmadụ na Mmekọahụ ojoo.
  17. Ijikọta onwe ya na ụlọ ọrụ ọ bụla ọzọ ma otu obula, nwere ebumnuche kpamkpam ma ọ bụ n'akụkụ, dịka nke Roost Foundation ma soro onye ọ bụla ma ọ bụ ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ iji kwalite ebumnuche ndị dị otú ahụ.[5]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Govts must criminalise out-of-court settlement of rape - Roost Foundation (en-US). . (2022-03-21). Retrieved on 2022-03-30.
  2. NACTAL, Roost foundation, collaborate to fight human trafficking, SGBV (en-US). The Sun Nigeria (2021-09-11). Retrieved on 2022-03-30.
  3. Human trafficking: Roost Foundation set for launch in Nigeria’s capital city, Abuja (en-US). Apex News Exclusive. Retrieved on 2022-03-30.
  4. ABOUT US (en-US). Retrieved on 2022-03-30.
  5. ABOUT US (en-US). Retrieved on 2022-03-30.