Rosalie Van der Gucht

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Rosalie Van der Gucht (27 Ọktoba 1908 - 31 Ọktobe 1985) bụ onye nkụzi ihe nkiri England na onye isi nke ngalaba okwu n'ihe nkiri na Mahadum Cape Town, nke onye n'akatọ akwụkwọ akụkọ chetara dị ka "otu n'ime ndị ukwu na akụkọ ihe mere eme nke ihe nkiri South Africa".

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Rosalie Else Van der Gucht na British Burma. Nne ya Florence Roberts, onye amụrụ na Tasmania, rụrụ ọrụ dị ka onye n'elekọta ụmụ eze Siam tupu ọ lụọ di; nna ya a mụrụ n'England bụ Claude Van der Gucht rụrụ ọrụ na Bombay-Burma Trading Company. Mgbe ọ dị afọ anọ, e zigara Rosalie van der Gucht ka ya na ndị ikwu ya biri na England. Ọ gara Tudor Hall na Chislehurst na Lycee Victor Duruy na Paris, ebe ọ nwetara diplọma n'omenala French. Ọ gụrụ akwụkwọ na Elsie Fogerty ma mesịa nweta diplọma na Dramatic Art na Mahadum London .

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ ka nọ n'England, Van der Gucht kuziri okwu na ihe nkiri na Malvern Girls' College site na 1927 ruo 1933. Ọ rụrụ ọrụ na kansụl London maka ndị nkuzi nke okwu na ihe nkiri, British Drama League's Panel of Adjudicators, ma kuzieri na Stanhope Women's Evening Institute na ụlọ akwụkwọ Croftdown. Ọ kuziri ma mee ihe nkiri dị ka onye otu Questors Theatre Club . [1]

Na 1939, n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, Van der Gucht hapụrụ England gaa South Africa, ịrụ ọrụ na Grahamstown Training College. N'afọ 1942, e were ya n'ọrụ ka ọ sonye na ngalaba na Mahadum Cape Town; ọ rụrụ ọrụ ma kuzieri ebe ahụ ruo mgbe ọ lara ezumike nká na 1971. Ọ ghọrọ onye isi nke ngalaba okwu na ihe nkiri na 1946. N'afọ 1956, ọ haziri ihe nkiri Cape Town maka ndị ntorobịa.

Mgbe ọ lara ezumike nká n'ọkwa agụmakwụkwọ ya, ọ gara njem ma kuzieri ihe nkiri. E nyere ya onyinye Three Leaf Award maka iduzi ya, na onyinye AA Mutual Life maka ọrụ na ihe nkiri, yana onyinye AA Vita maka onyinye agụmakwụkwọ ya. Taa, e nwere Rosalie van der Gucht Prize maka ndị nduzi ọhụrụ, aha ya bụ na ncheta ya.[2]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Otu onye bụ nwa akwụkwọ chetara Van der Gucht dị ka "onye n'eme ihe n'adịghị mma, ma ọ dịghị mgbe ọ dị njọ onye n'eme egwu punk tupu oge ya, onye n'emegide mmadụ na nwa agbọghọ n'amaghị nwoke, onye n'eme nwalee Merlin na onye nkuzi n'erigbu mmadụ. " Rosalie Van der Guqt nwụrụ na 1985, na Cape Town. [3] Akwụkwọ ya dị na Human Sciences Research Council na Mahadum nke Cape Town Archives . [1]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Gay Morris, "A Critical Biography of Rosalie Van der Gucht: Investigating her Contribution to Education in South Africa with Special Reference to Speech and Drama" (M. A. thesis, University of Cape Town 1989).
  2. "Fleur du Cap Theatre Award Winners" Cape Times (20 March 2016).
  3. Alfred Emmet, "In Fondest Memory: Rosalie van der Gucht (d. 1985)" The Questors Archives (January 1986).