Rose Christiane Raponda

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rose Christiane Raponda
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGabon Dezie
Aha enyereRose, Christiane Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1964 Dezie
Ebe ọmụmụLibreville Dezie
Ọrụ ọ na-arụcivil servant, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jimayor, Prime Minister of Gabon, Minister of Finance and Economy Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịGabonese Democratic Party Dezie
agbụrụMpongwe people Dezie
Rose Christiane Raponda

Rose Christiane Ossouka Raponda (amụrụ na ubochi nke 30 na onwa June n'afo 1963) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Gabon nke jere ozi dị ka osote onye isi ala nke Gabon kemgbe Jenụwarị 2023, na-eme ka ọ bụrụ osote onyeisiala nwanyị mbụ nke mba ahụ.[1][2][3][4][5][6] Ọ rụrụ ọrụ dị ka praịm minista nke Gabon site na Julaị 2020 ruo Jenụwarị 2023, ọ bụkwa nwanyị mbụ bụ praịm praịm dinara na mba ahụ.[7] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi obodo Libreville ma mesịa bụrụ minista na-ahụ maka nchekwa mba ahụ site na Febụwarị n'afo 2019 wee ruo Julaị 2020.

A mụrụ Raponda na ubochi 30 na onwa June n'afo 1963 na Franceville.[8] Raponda bụ onye otu Mpongwe.[9] Raponda nwetara akara ugo mmụta na akụ na ụba na ego ọha na eze site na Gabonese Institute of Economy and Finance.[10]

Raponda rụrụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwa nke akụ na ụba na osote onye isi nchịk nke ụlọ akụ nke Gabon.[10] Ọ rụrụ ọrụ dị ka minista na-ahụ maka mmefu ego na ego ọha na eze site na onwa Febụwarị n'afo 2012 ruo Jenụwarị na afo 2014.[10][11] A họpụtara Raponda ka ọ bụrụ onye isi obodo Libreville na ubochi nke iri abuo na isii na onwa Jenụwarị na afo 2014, na-anọchite anya ndị na-achị Gabonese Democratic Party.[9] Ọ bụ nwanyị mbụ nwere ọkwá ahụ kemgbe 1956 ma jee ozi ruo 2019.[12][13] Ọ ghọkwara onye isi oche nke United Cities na Local Governments Africa.[14]

N'abalị iri na abụọ n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2019, onye isi ala Ali Bongo Ondimba họpụtara Raponda ka ọ bụrụ Minista Nchebe nke Gabon mgbe nnupụisi ahụ dara na Jenụwarị n'afọ 2019.[13][15][16] Raponda nọchiri Etienne Massard Kabinda Makaga, onye so na ezinụlọ Bongo, onye gi dere ọkwa ahụ kemgbe afo 2016.[17] N'abalị iri na isii n'ọnwa Julaị na afọ 2020, a họpụtara Raponda dị ka praịm minista nke Gabon, mgbe onye bu ya ụzọ bụ Julien Nkoghe Bekale kwụsịrị.[12] Ọ bụ nwanyị mbụ nwere ọnọdụ ahụ. Nhọpụta ya bụ nke anọ Ondimba mere kemgbe nnupụisi ahụ dara.[18] Nhọpụta ya na-abịa n'oge nsogbu ahụike abụọ na akụ na ụba n'ihi ọrịa COVID-19 na ọdịda nke ọnụahịa mmanụ, otu n'ime isi akụ na ụba nke mba ahụ.[19]

  1. Biographie du Premier Ministre Chef du gouvernement Alain-Claude Bilie-By-Nze.
  2. Rose Christiane Ossouka de maire de Libreville à ministre de la Défense nationale (31 January 2019).
  3. Exécutif : Ossouka-Raponda, première femme cheffe du gouvernement (17 July 2020).
  4. "Gabon names vice-president and new prime minister", Reuters, 9 January 2023. Retrieved on 10 January 2023.
  5. Gabon: Rose Christian Ossouka Raponda named first-ever female VP (9 January 2023). Retrieved on 10 January 2023.
  6. Gabon Names Vice-President and New Prime Minister (9 January 2023). Retrieved on 10 January 2023.
  7. Mouega (16 July 2020). Gabon: Rose Christiane Ossouka Raponda nommée Premier ministre (fr). Gabon Media Time. Archived from the original on 17 July 2020. Retrieved on 16 July 2020..
  8. Rose Christiane Ossouka Raponda (fr). Leaders Afrique (22 September 2015).
  9. 9.0 9.1 Dougueli (21 January 2014). Gabon : Rose Christiane Ossouka Raponda, le nouveau visage de Libreville (fr). Jeune Afrique. Retrieved on 14 July 2019.
  10. 10.0 10.1 10.2 Gras (12 February 2019). Gabon : Rose Christiane Ossouka Raponda, de la mairie de Librevelle au ministère de la Défense (fr). Jeune Afrique. Retrieved on 14 July 2019.
  11. Gabon: Mrs Rose Christiane Ossouka Raponda elected Mayor of Libreville. All Africa (27 January 2014). Archived from the original on 12 September 2015. Retrieved on 14 July 2019.
  12. 12.0 12.1 Gabon appoints first woman prime minister amid government shakeup. Reuters (July 16, 2020). Retrieved on July 16, 2020.
  13. 13.0 13.1 Rose Christiane Ossouka Raponda in uncharted territory. Africa Intelligence (13 February 2019). Retrieved on 14 July 2019.
  14. Meetings of the Statutory Bodies for United Cities and Local Governments of Africa (UCLG Africa) & International Conference: African Cities: Engines of Sustainable Development – Cairo, Hotel Conrad, June 17-20, 2019. Africa News (27 June 2019). Archived from the original on 14 July 2019. Retrieved on 14 July 2019.
  15. Ndungidi (30 January 2019). Gabon: Rose Christiane Ossouka Raponda nommée ministre de la défense (fr). African Shapers. Retrieved on 14 July 2019.
  16. Solo,mon (24 February 2019). African Women Surmount Obstacles to Redefine Their Countries' Militaries. VOA News. Retrieved on 14 July 2019.
  17. Gabon cabinet reshuffle. Africa News (31 January 2019). Retrieved on 14 July 2019.
  18. Eric Mbog Batassi. "Gabon Names First Woman as Prime Minister in Cabinet Reshuffle", Bloomberg.com, July 16, 2020. Retrieved on July 16, 2020.
  19. Gabon: A woman appointed Prime Minister, a première. The North Africa Post (17 July 2020). Retrieved on 17 July 2020.