Rose Leon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rose Agatha Leon, 1975

Rose Agatha Leon (20 Ọktoba 1911 - 16 Ọgọstụ 1999) bụ nwanyị ọchụnta ego na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Jamaica. [1]'ọnwa Ọgọstụ afọ 1999, e gburu ya n'ụlọ ya.

A mụrụ Leon n'aka onye na-ahụ maka ọgwụ, Benjamin Joseph Huie, na Adella née Murray Hui na 20 Ọktoba 1911 na Saint Ann Parish. Ọ gụrụ akwụkwọ na Central Branch Elementary School na Wolmer's Girls' School, ma na Jamaica, ma me sịa na New York City na Abyssinian School of Cosmetic Chemistry. Leon lụrụ Arthur Alexander Leon [2]32; di na nwunye ahụ mụrụ ụmụ abụọ.

Leon malitere ịrụsi ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mbido afọ 1940, mgbe ọ ghọrọ onye kansụl maka Kingston na St. Andrew Corporation. Site na 1944 ọ bụ onye otu Jamaica Labour Party (JLP). [2]

N'afọ 1948, ọ ghọrọ onye isi oche nke Jamaica Labour Party, na-eme ka ọ bụrụ nwanyị mbụ bụ onye isi oche otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba. Leon [3] n'ọkwa ahụ ruo afọ iri na abụọ. [4][2]'afọ 1949, a họpụtara ya n'ime ụlọ ndị nnọchi anya Jamaica, n'afọ 1953 kwa, a họpụtara ọ ka ọ bụrụ minista na-ahụ maka ahụike na ọdịmma ọha na eze, na-arụ ọrụ ahụ ruo n'afọ 1955. Leon nwere oche ya na ntuli aka nke afọ 1955, na-emeri onye na-azọ ọkwa PNP William Seivwright. [3]'afọ 1960, ọ hapụrụ JLP n'ihi enweghị nkwado maka Federation of the West Indies. Leon enweghị ike imeri nhọpụta ọzọ [2] ka onye nweere onwe ya, [1] ma n'oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ sonyeere People's National Party . Ọ laghachiri n'ọkwa dị elu na 1969, a họpụtara ya dị ka onye kansụl mpaghara, na-eduzi Kọmitii okporo ụzọ na ọrụ mpaghara site na 1969 ruo 1972, ma merie ntuli aka na 1971 ruo otu afọ dị ka osote onye isi obodo nke Kingston. [3] [2] Site [4] 1972-1976 ọ bụ Minista nke Gọọmentị Obodo na gọọmentị Manley, [1] ma n'ime afọ anọ sochirinụ ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye minista nke nchekwa ọha na eze. [2]'afọ òtù pụkụ narị itolu na ịri asatọ, ọ lara ezumike nká na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Site na 1951 ruo 1999 Leon bụ onye ọka ikpe ukwu nke udo na St. Andrew . [2]

Mgbe ọ lọghachiri Jamaica site n'ịmụ kemịstiri na US, ya na di ya hiwere Leon School of Beauty Culture. Ọ bụ onye isi ụzọ n'usoro ngwaahịa ịchọ mma a na-eme n'ógbè ahụ. Ma ruo ọnwụ ya, [3]Leon kụziri ihe n'ụlọ akwụkwọ ahụ.

Leon so nyere na ntọala nke Jamaica Federation of Women na 1944, Jamaica Manufacturers' Association na 1947, ma kwado maka West Indies' Federation. O wepụtara onwe ya n'ọtụtụ ebe. N'afọ 1956, John Lindsay, onye isi obodo nyere Leon mkpịsị igodo nke obodo New York. Afọ abụọ ka e mesịrị, ọ gara Liberia na ario nke William Tubman, onye isi ala mba ahụ. N'afọ 1982, e mere ya onye isi nke Order of Distinction. [2]O nweta kwara onyinye dị iche iche site n'aka ndị ọzọ na Jamaica.

Ọtụtụ ndị ohi gburu Leon n'ọnwa Ọgọstụ afọ otú puku , narị itolu na ịrị itolu na itolu, mgbe ọ nọ n'ụlọ ya na Kingston, Jamaica. Ọ dị afọ iri asatọ na ise. Mgbe e gbusịrị ya, ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Jamaica rịọrọ mgbaghara maka ịkwalite ọnọdụ nke dugara na igbu ọchụ dị otú ahụ. Anthony Abrahams, onye bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye na-eme ihe ngosi redio, kwuru, sị, "Anyị bụ akụkụ nke usoro ahụ...Anyị bụ otu n'ime steeti dara ada ma n'ihi ya anyị dara mba ahụ. Site na ohere niile m nwere, m banyere n'ime usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'enweghị ihe ọ bụla na-akwado ya. "Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ kwụghachiri echiche ya. [5] [2]'afọ pụkụ abụo na ise, ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ nwanyị nke Jamaica mepụtara okwuchukwu kwa afọ na ncheta ya. [1]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ụmụ nwanyị nọ n'Ụlọ Ndị Nnọchiteanya nke Jamaica

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sinclair. "Madame Leon slain", Jamaica Gleaner, 17 Aug 1999. Retrieved on 2013-08-25.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 2.7 2.8 Knight (2016-01-01). "Leon, Rose (1911–1999), politician and community leader", Dictionary of Caribbean and Afro–Latin American Biography. Oxford University Press. DOI:10.1093/acref/9780199935796.001.0001. ISBN 978-0-19-993579-6. 
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Rowe. "Rose Leon, Outspoken Jamican politician who always put people first", The guardian, 23 August 1999. Retrieved on 2013-08-25.
  4. 4.0 4.1 Worldwide Guide to Women in Leadership. Retrieved on 2013-08-25.
  5. Gonzalez (October 18, 1999). A Killing Shocks Jamaicans Into Soul-Searching. The New York Times. Retrieved on 2021-04-16.