Rose Mukankomeje

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rose Mukankomeje
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịRwanda Dezie
Ọrụ ọ na-arụenvironmentalist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
onye were ọrụRwanda Environment Management Authority Dezie
Rose Mukankomeje
OccupationPolitician, biologist, environmental activist
Rose Mikankomeje

Rose Mukankomeje bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịch na Rwanda, ọnye gụrụ maka ihe gbasara ihe ndị dị ndụ, nakwa onye ihe gbasara gburugburu ebe obibi, onye ọrụ ya na-ekwu maka nchekwa nke oké ọhịa Rwanda.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mukankomeje rụrụ ọrụ dị ka onye otu ndị omeiwu Rwanda site n'afọ 1995 ruo afọ 2001.[1]

Mukankomeje rụrụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwaụlọ ọrụ nke Rwandan akpọrọ Environment Management Authority (REMA). Ọrụ ya wetara n;afọ 2011 ihe nrita akporọ Future Policy Award maka National Forest Policy nke Rwanda, nke kwuru na Rwanda nwere "nnukwu mgbanwe n'ụzọ na-ebelata oke ọhịa".[2]

N'afọ 2013, Mukankomeje natara onyinye akpọrọ Forest Hero Award site na mba United Nations Forum n'ihe gbasara nchekwa oke ọhịa.[3] Ihe nrite ahụ gbadoro ụkwụ na ọrụ ya banyere ikụ osisi kwa ọnwa n'ime obodo , nkwalite ọrụ ugbo nke akpọrọ sustainable agriculture, nakwa ọrụ ya maka national plastic bag ban.

Mukankomeje dị ka akụkụ nke ndị nnọchi anya Rwanda na Paris Climate Talks (COP21), 2015

N'ọnwa Machị n'afọ 2016, a chụpụrụ Mukankomeje n'ọrụ REMA site na nyocha e mere, n;imeebubo mpụ na aghụghọ.[4] E boro ya ebubo na ọ mebiri ihe eji n;aka agba akaebe, ihe nzuzo nke ndị ọkachamara, na imebi ugwu nke ụlọ ọrụ gọọmentị, Aka kpaara ya ka ọnwa Machị dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ, ma kpụpụ ya ụlọ ikpe maka ima ikpe, ma emechara hapụ ikpe a mara ya n'ọnwa September n'afọ 2016.[5][6][7]

N'afọ 2019, a họpụtara Mukankomeje dịka onye isi nchịkwa nke Kansụl Mmụta dị elu (HEC) na Rwanda.

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Mukankomeje nọ na mba ofesi agụ akwụkwọ mgbe egbukpọ agbụrụ na Rwanda, nke metụtara nne na nna ya na ụmụnne ya. Mgbe ọ laghachiri Rwanda, ọ ghọrọ nne na nna ndị na enweghi nne na nna maọbụ ezinulọ di iri abụọ na abụọ.

Mukankomeje nwetara Ph.D. na Biology n'afọ 1992.

Akwụkwọ ndị a họọrọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Mukankomeje, R., F. Laviolette, na J-P. Descy. Nri nke Tilapia, Oreochromis niloticus, nke Lake Muhazi (Rwanda). Annals de Limnologie-International Journal of Limnology 30.4 (1994).
  • Mukankomeje, R., Plisnier, PD., Descy, JP. na ndị ọzọ. Ọdọ Mmiri Muzahi, Rwanda: ihe limnological na mmepụta phytoplankton. Hydrobiologia 257, 107 Xia120 (1993). https://doi.org/10.1007/BF00005951
  • Mukankomeje, R., Micha, J. C., Descy, J. P., & Frank, V. Mmepụta nwere ike nke ụdị a na-ewebata (Protopterus aethiopicus Heckel, 1871) dabere na usoro okike Lake Muhazi (Rwanda). Mededelingen der Zittingen-Koninklijke Academie voor Overzeese Wetenschappen (1996).

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. United Nations Forum on Forests » Africa (en-US). www.un.org. Retrieved on 2022-03-09.
  2. Forest policies in Rwanda, United States and Gambia win UN-backed awards (en). UN News (2011-09-21). Retrieved on 2022-03-10.
  3. United Nations Forum on Forests » UNFF » One woman's heroic efforts to restore more than just Rwanda's forests (en-US). www.un.org. Retrieved on 2022-03-09.
  4. Senate Powers to Confirm Officials Creates Heated Debate in Plenary (en-US). KT PRESS (2019-11-14). Retrieved on 2022-03-09.
  5. REMA boss Mukankomeje arrested (en). The New Times | Rwanda (2016-03-21). Retrieved on 2022-03-17.
  6. Mukankomeje appeals remand decision (en). The New Times | Rwanda (2016-04-09). Retrieved on 2022-03-17.
  7. Prosecution withdraws case against Rose Mukankomeje (en). The New Times | Rwanda (2016-09-30). Retrieved on 2022-03-10.