Rose Mukantabana

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rose Mukantabana
Born (1961-08-31) 31 Ọgọstụ 1961 (age 62)
NationalityRwandan
Occupationlawyer, politician, women's rights activist
Years active1980-
Known forFirst female head of the Chamber of Deputies, chair of African Parliamentary Union
Rose Mukantabana
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịRwanda Dezie
Aha enyereRose Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Ọgọọst 1961 Dezie
Ebe ọmụmụNyanza District Dezie
Ọrụ ọ na-arụwomen's rights activist, onye na-akwado ikike mmadụ, onye ọka iwu, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, oka mmuta Dezie
ụdị ọrụ yalaw Dezie
Ọkwá o jideputy, Speaker of the Chamber of Deputies of Rwanda, Member of the Chamber of Deputies of Rwanda Dezie
ebe agụmakwụkwọNational University of Rwanda Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1980 Dezie

Rose Mukantabana (amụrụ n'abalị iri atọ na otu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1961) bụ onye ọka iwu na onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru ụmụ nwanyị. Ọ bụ onye bụbu onye isi oche nke Chamber of Deputies nke Rwanda ma bụrụ nwanyị mbụ a họpụtara n'ọkwa ahụ. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke African Parliamentary Union site na afo 2013-2015.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Rose Mukantabana na 31 Ọgọst na afọ 1961 na mpaghara Nyanza District, Southern Province, Rwanda. Ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị wee malite ịrụ ọrụ na ọrụ gọọmentị na afọ 1980, nke mbụ na Rwanda Society for Insurance ma mesịa na Ministry of Public Services.[1][2] N'afọ 1992, ọ banyere na Mahadum Mba nke Rwanda ma gụsịrị akwụkwọ na nzere iwu n'afọ 1996. N'afọ ahụ, ọ malitere ịrụ ọrụ maka Haguruka Association, otu NGO nke na-ele anya na ikike mmadụ na ikike ụmụ nwanyị na ụmụaka.[1] N'ịbụ onye nọrọ afọ itoolu na nzukọ ahụ, ọ malitere dị ka onye enyemaka iwu ma rụọ ọrụ ruo onye nhazi nke okwu iwu. Mgbe ọ rụchara ọrụ dị ka National Executive Secretary, Mukantabana laghachiri n'ụlọ akwụkwọ.[3] N'ịmụ akwụkwọ na Belgium, ọ nwetara diplọma "ndị pụrụ iche na ikike mmadụ" na Mahadum Saint-Louis Bruxelles.[1][2]

N'afọ 2002, ọ na-eje ozi dị ka osote onye isi oche nke Pro-Femmes, otu òtù na-ahụ maka udo nke na-ahazi mbọ nke 43 NGO maka mmepe na ikike ụmụ nwanyị.[4][2] N'afọ 2005, ọ malitere ịrụ ọrụ dị ka onye nhazi mba nke Women's Legal Rights Initiative nke USAID kwadoro ma na afọ 2007, ọ kwagara ActionAid International na Rwanda, nke mbụ na-eje ozi dị ka onye nchịkwa ikike ụmụ nwanyị ma mesịa bụrụ onye njikwa mmepe mmemme.[3] N'afọ 2008, a họpụtara ya dị ka onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Kigali City.[1] N'abalị isii n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2008, ndị omeiwu ibe ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke Chamber of Deputies nke Rwanda ruo n'afọ 2013 site na 70 maka na 10 megide.[5][1] Nhọrọ ya mere ka ọ bụrụ nwanyị mbụ na-eduzi ndị omeiwu.[5] N'afọ 2012, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke African Parliamentary Union (APU) ruo n'afọ 2015.[6]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Nzabandora. "Parlement : Qui est la présidente de la chambre des députés ?", Rwanda News Agency, 2 December 2008. Retrieved on 6 October 2015. (in French)
  2. 2.0 2.1 2.2 Rose Mukantabana. Institute for Inclusive Security (June 2009). Retrieved on 5 October 2015.
  3. 3.0 3.1 Chamber Of Deputies. Republic of Rwanda Parliament. Archived from the original on 14 July 2019. Retrieved on 5 October 2015.
  4. Overcoming War's Devastating Health Legacy in Africa's Great Lakes Region. Fondo de Población de las Naciones Unidas/United Nations Population Fund (17 June 2002). Archived from the original on 5 October 2015. Retrieved on 5 October 2015.
  5. 5.0 5.1 "Rose Mukantabana", Jeune Afrique, 29 December 2008. Retrieved on 6 October 2015. (in French)
  6. Karuhanga. "Mukantabana to head Africa's MPs forum", The New Times, 3 December 2012. Retrieved on 6 October 2015.