Roy Campbell

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Roy Campbell

 

Ignatius Royston Dunnachie Campbell, onye a mara nke ọma dị ka Roy Campbell (2 Ọktoba n'afọ 1901 wee rụọ 23 Eprel afọ 1957), bụ onye na-ede uri na obodo South Africa, onye na-enyocha akwụkwọ, onye ntụgharị akwụkwọ, onye na'ede uri agha, na onye na-eme ihe ọchị.

A mụrụ ya na ezinụlọ White South Africa nke sitere na obodo Scotland na Durban, Colony of Natal, e zigara Campbell England ịga Mahadum Oxford. Kama , Campbell banyere n'akwụkwọ akụkọ nke London. Mgbe ọ lụsịrị Mary Garman, Campbell dere uri a nabatara nke ọma The Flaming Terrapin nke mere ka Campbells banye n'ọkwa kachasị elu nke akwụkwọ ndị Britain.

Mgbe ọ kwadoro ịha nhata agbụrụ n'oge ọ nọrọ na South Africa dị ka onye nchịkọta akụkọ nke akwụkwọ akụkọ Voorslag, Campbell laghachiri England wee sonye na Bloomsbury Group. Campbell mechara kpebie na Bloomsbury Group bụ ndị na-eme mpako, ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ, ndị na'enweghị ihe ọ bụla, na ndị na-emegide Ndị Kraịst. Campbell kwutọrọ ha n'abụ uri a na-akpọ The Georgiad, nke mebiri aha na ọdịmma Campbell n'etiti ndị edemede. Mgbanwe Campbell na-esote gaa na Roman Katọlik na Spain na nkwado olu maka Francisco Franco na ndị Nationalists mere ka ndị na-ede akwụkwọ nwere mmetụta dị n'aka ekpe kpọọ ya onye Fascist, na-emebi aha ya dị ka onye na-ede uri. Campbell jere ozi na ndị agha Britain n'oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ gara nzukọ nke The Inklings n'oge a ma bụrụ enyi C. S. Lewis na J. R. R. Tolkien.

N'oge agha gachara, Campbell gara n'ihu na-ede ma na-asụgharị uri na nkuzi. Ọ sonyekwara ndị edemede na ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na White South Africa, gụnyere Laurens van der Post, Alan Paton, na Uys Krige, na-akatọ ịkpa ókè agbụrụ na South Africa. Campbell nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala na obodo Portugal na Mọnde Ista, n'afọ 1957.

Mana Campbell by onye etinyere n'uche byT. S. Eliot, Dylan Thomas, and Edith Sitwell e bụ ezigbo onye nde egwu site na first Second World Wars, the accusation that he was a fascist, which was first promulgated during the 1930s, continues to seriously damage his reception, though some critics have attempted to rehabilitate his reputation.