Ruff 'n' Tumble (clothing)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ruff 'n' Tumble logo

Ruff 'n' Tumble bụ akara ejiji Naijiria nke na-ahụ maka uwe ụmụaka[1][2][3][4]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

E guzobere Ruff 'n' Tumble n'afọ 1996 mgbe Adenike Ogunlesi chọrọ pyjama maka ụmụ ya.[2][5][6] Ebe ọ bụ na ọ na-eme uwe maka ụmụ nwanyị, o kpebiri ime uwe site n'enyemaka nke nne ya, onye na-emepụta ejiji.[7][2] Na mbụ, o jiri ihe ndị dị n'ógbè ahụ gụnyere Ankara na Adire.[6] Mmepụta malitere ma mesịa gbasaa ọrụ na ezinụlọ ndị ọzọ Naijiria nwere ụmụaka. Mmepụta uwe (maka ụmụaka site na afọ efu ruo afọ iri na isii), jiri nwayọọ nwayọọ na-aga n'ihu site n'ụlọ ya (na-ere site na buutu nke ụgbọ ala ya) gaa n'ebe dị na Victoria Island, Lagos Steeti.[2][7] Ruff 'n' Tumble na-arụ ọrụ ụlọ nkwakọba ihe, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, nkesa ma nwee ihe karịrị ndị ọrụ iri ise.[8][2] Ọ gbatịkwara alaka ya na Surulere na Lagos, na Ikeja, yana, obodo ndị ọzọ dị na Naijiria, gụnyere, Ibadan, Kano na Port Harcourt.[9][1][10] Ụlọ ọrụ ahụ nwere ihe dị ka alaka ụlọ ọrụ iri na ise gafee mba ahụ.[8] Ruff 'n' Tumble nwekwara akara "Trendsetters" na "NaijaBoysz" - uwe maka ụmụ okorobịa dị afọ asatọ ruo afọ iri na isii. [2][9][10][11] Ruff 'n' Tumble jikọtara aka na Nigerian Employers Consultative Association (NECA) na Industrial Training Fund (ITF) iji nyere aka belata enweghị ọrụ na mba ahụ.[12]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Kemi Ajumobi. "Adenike Ogunlesi, leading contemporary kids clothing brand in Nigeria", Businessday. Retrieved on December 24, 2014.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 building an African clothing empire Adenike Ogunlesi. Ventures Africa. Archived from the original on July 1, 2014. Retrieved on August 29, 2014.
  3. "Ruff 'n' Tumble introduces promo for kids", Punch. Retrieved on December 24, 2014.
  4. Don Tudoran (2005). Democracy at Large: Listen to Africa. 
  5. "Government does not support the garment industry-Adenike Ogunlesi", The Punch. Retrieved on December 25, 2014.
  6. 6.0 6.1 "How we started Ruff 'n' Tumble by Mrs Ogunlesi", Daily Independent, February 1, 2013. Retrieved on November 28, 2014.
  7. 7.0 7.1 Adenike Ogunlesi – Ruff N Tumble. Financial Freedom Inspiration. Archived from the original on November 22, 2014. Retrieved on December 24, 2014.
  8. 8.0 8.1 Adenike Ogunlesi. Summit Speakers. Archived from the original on December 26, 2014. Retrieved on November 28, 2014.
  9. 9.0 9.1 "Adenike Ogunlesi: Ruff 'n' Tumble", Houston Forward Times. Retrieved on December 24, 2014.
  10. 10.0 10.1 "Advertisement Ruff 'n' Tumble introduces new brand "NaijaBoysZ" and opens new stores in Port Harcourt & Lagos", BellaNaija. Retrieved on December 24, 2014.
  11. Adenike Ogunlesi. Open Africa. Archived from the original on 2014-12-26.
  12. News Agency of Nigeria. "40 million Nigerians still unemployed", Nigerian Guardian, December 3, 2014. Retrieved on December 25, 2014.