Ruqayyah Ahmed Rufa'i

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ruqayyah Ahmed Rufa'i
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereRuqayyah Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1958 Dezie
Ebe ọmụmụRingim Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Education of Nigeria, Minister of Education of Nigeria Dezie

Ruqayyah Ahmed Rufa'i (amụrụ na 1958) bụ onye ahọpụtara dika Minista nke agụmakwụkwọ n'afọ 2010 mgbe deputị onye isi ala Goodluck Jonathankwupụtara ndị ya na ha ga-arụkọ ọrụ[1][2].

A mụrụ Rufai na Ringim na Jigawa Steetị, Ọ nwetara digịri na nzere mastas ya na mmụta ihe mere eme na Mahadum Bayero, Kano na 1981 na 1987. PhD na agụmakwụkwọ na Mahadum West Virginia, US, na 1991. Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka Ahụike n'ọchịchị Gen. Sani Abacha site na 1993 ruo 1996.

A bulitere ya na prọfesọ na 2003, ma jee ozi dịka kọmishọna nke agụmakwụkwọ na sayensị na teknụzụ na Jigawa Steetị.[3] O kwuru na ihere na-eme ya mgbe ọ bụla o chere maka ihe gbasara agụmakwụkwọ nke ụmụazi nwanyị na Jigawa Steetị, ọ na-esiri ya ike ịkọwa ihe kpatara ndị gọọmentị steeti ya enweghị ike idebanye aha ụmụazi ahụ n'ụlọ akwụkwọ.[4] Ọ mere iwu na ụmụaka ụlọ akwụkwọ sekọndrị agahi eji ekwentị mkpanaaka n'ihi ọ na-adọpụ ha uche.[5]

Ihapụ Ọfịs Ndị Ozi[dezie | dezie ebe o si]

N’etiti nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị na pati na-achị bụ People Democratic Party (PDP) ebe ndị gọvanọ asaa, gụnyere Sule Lamido nke Jigawa Steeti, na ọtụtụ ndị sinetọ na ndị otu nnochite anya ndị omeiwu kewasịrị New PDP, onye isi ala bụ Goodluck Ebele Jonathan wepụrụ ndị minista itoolu n’ọkwa ha. Prof. Ruqayyat so na ndị minista nsogbu ahụ metụtara[6].

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ministers - the Profiles (ii). ThisDay (8 April 2010). Retrieved on 2010-04-14.
  2. 5 women who have made their marks in education.
  3. Ministers - the Profiles (ii). ThisDay (8 April 2010). Retrieved on 2010-04-14.
  4. Ahmed Abubakar. I’m ashamed, Jigawa can’t enroll enough girls in schools, says commissioner. Peoples's Daily. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2010-04-13.
  5. Ahmed Abubakar. Jigawa restricts students on use of GSM phones. Peoples's Daily. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2010-04-13.
  6. Jonathan sacks 9 ministers https://web.archive.org/web/20170202051327/http://africanspotlight.com/2013/09/11/jonathan-sacks-9-ministers/