Ruth Adler

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  Ruth Margaret Adler née Oppenheimer (1 Ọktoba 1944 - 18 Febụwarị 1994) bụ onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị, onye na-eme mkpọsa maka ihe ndị ruuru mmadụ na onye na-akwado ọdịmma ụmụaka. Ọ bụ onye guzobere ụlọ ọrụ Amnesty International na Scotland dịka onye ọrụ mbụ ha na Scotland n'afọ 1991.[1] Ọ bụ onye guzobere Scottish Women's Aid n'afọ 1974, onye otu Lothian Region Children's Panel ma nyere aka guzobe Scottish Child Law Centre.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Nne na nna Ruth bụ Charlotte na Rudolf Oppenheimer si Germany bịa Britain dịka ndị gbara ọsọ ndụ n'afọ ndị 1930. A mụrụ Ruth na Devon, ebe nna ya nọ n'oge agha.

Ọ gụrụ nkà ihe ọmụma, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na akụ na ụba na Somerville College, Oxford na MA na nkà ihe ọmụma na Mahadum London.[2] Ya na di ya na ụmụ ya kwagara Scotland n'afọ ndị 1960 wee bụrụ onye nkuzi oge na Ngalaba Nkà Ihe Ọmụma nke Mahadum Edinburgh ruo ọtụtụ afọ tupu ya enweta PhD ọzọ na Iwu na-eweta thesis 'Rights, interests and reasoning in juvenile justice'.[3] Onye nlekọta ya bụ Neil MacCormick nwere mmetụta n'ebe ọ nọ. Adler na-asụ asụsụ abụọ na Bekee na German ma, mgbe ọ nwetasịrị PhD ya, ya na MacCormck jikọrọ aka n'ịsụgharị ọtụtụ akwụkwọ site n'aka ndị ọkà ọmụma Czech (Ota Weinberger) na German (Robert Alexy, Guenter Teubner) site na German gaa na Bekee.

Mgbe ọ na-arụ ọrụ na The Scottish Child Law Centre, o nyere aka mepụta nchekwa data zuru oke mbụ nke iwu ụmụaka na Scotland.[4] Ọ bụ onye majie na onye ọka ikpe nke udo. Site n'afọ 1987 ruo 1991 ọ bụ ya na-ahụ maka nyocha mkpesa megide ndị ọka iwu dị ka onye enyemaka Lay Observer maka Scotland.[5]

Dịka onye ama ama n'obodo ndị Juu nke Edinburgh ọ bụ onye nchịkọta akụkọ nke Edinburgh Star. na odeakwụkwọ na onye isi oche (1998) nke Edinburgh Jewish Literary Society.[2][6][5]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Inspirational Women's Day. www.amnesty.org.uk. Retrieved on 2017-06-09.
  2. 2.0 2.1 "RuthAdler", 2013-05-21. Retrieved on 2017-06-09. (in en-US)
  3. Adler (1983). "Rights, interests and reasoning in juvenile justice" (in en). 
  4. Ewan (2006-03-08). The Biographical Dictionary of Scottish Women (in en). Edinburgh University Press. ISBN 9780748626601. 
  5. 5.0 5.1 Cheetham. "Obituary: Ruth Adler", The Independent, 1994-02-26. Retrieved on 2017-06-09. (in en-GB)
  6. HISTORY - Page 1 (en). www.edinburghstar.info. Archived from the original on 2018-12-11. Retrieved on 2017-06-09.