Ruth Lawanson

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ruth Lawanson
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
obodo maka egwuregwuNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereRuth Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Septemba 1963 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwuregwu volleyball Dezie
onye were ọrụUniversity of Nevada, Reno Dezie
ebe agụmakwụkwọClovis West High School Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuFresno State Bulldogs women's volleyball, United States women's national volleyball team, Q3416303, Q114444643 Dezie
ụdị egwuregwuvolleyball Dezie
so navolleyball at the 1992 Summer Olympics – women's tournament, 1990 FIVB Women's Volleyball World Championship Dezie

Ruth Modupe Lawanson (amụrụ Septemba 27, 1963 na Naijiria) bụ onye isi koochi otu egwuregwu volleybọl nke Mahadum Nevada. Ọ gbara maka Fresno State na ndị otu egwurewgu mba United States, nweta otu ọla nchara na 1992.

Ọrụ volleybọl[dezie | dezie ebe o si]

Kọleji[dezie | dezie ebe o si]

Lawanson gbaara otu egwuregwu nke Fresno State, akpọọrọ ya aha MVP n'afo 1982, 1983,na 1984. N'afo 1984, ọ duru ndị Bulldogs gaa ebe nke ise na asọmpi NCAA, akpọrọ ya aha NorPac onye na-agba bọl kacha mma. A kpọkwara ya 1984-85 nwaanyị ọgba volleybọl kacha mma na Fresno state maka afọ 1984 na '85. Lawanson bụ nwaanyị egwuregwu mbụ lara akara zumike nká mgbe ọ ka nọ na-ụlo akwukwo.. Ọ sonye na-otu ndị egwurewgu Fresno state na asopụrụ.

Mba[dezie | dezie ebe o si]

Lawanson gbaara ndị otu mba U.S afọ anọ. O meriri nrite ọla nchara na asọmpi mba ụwa nke 1990, na 1991, na olimpik nke1992.[1]

Ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Lawanson gbara nnụkwu klọb Volleybọl nke Dallas Belles na Minnesota Monarchs site na 1987 ruo 1989. A kpọrọ ya aha MVP nke njikọ volleybọl ahụ na 1988[2]. O mechara gbaa na Italy ma na France site na 1992 ruo 1995[3].

Ọrụ koochi[dezie | dezie ebe o si]

Lawanson rụrụ ọrụ dika koochi na-enyere aka na Mahadum Purdue maka afọ anọ, ma na Fresno Steetị maka afọ isii, ma na-ụlọ mmuta ndị United States Air Force maka afọ abụọ ma na Mahadum Nevada maka otu afọ. Ọ bubụ onye isi koochi na Angelo State maka afọ egwurewgu atọ ebe o kere ọtụtụ ndeko dị iche ịche. Mechara bụrụ onye isi koochi ndi Nevada na 2011[4]. N’ọnwa Nọvemba afọ 2014, ọ hapụrụ ọkwa ahụ.[5]

Ndụ ya n'ime[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Lawanson na Septemba 27, 1963, na Ibadan, Oyo, Naijiria, ọ dị sentimita 5’8 n’ogologo[6]. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Fresno State nweta digiri na nchịkwa azụmahịa na 1987. Ọ rụọla ọrụ dịka onye otu ndị isi oche nzukọ ndị koochi volleybọl na America[7].

Lawanson lụrụ Shawn Kenan na 2002. Mana ha mere nkewa na 2015[8]. Nwanne ya bụ Foluke Akinradewo, gbakwara egwuregwu volleybọl nke mba U.S.[9]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Ruth Lawanson Profile". nevadawolfpack.com. Retrieved August 21, 2012.
  2. "Ruth Lawanson Profile". nevadawolfpack.com. Retrieved August 21, 2012.
  3. "Ruth Lawanson" Àtụ:Webarchive. gobulldogs.com. Retrieved August 21, 2012.
  4. "Ruth Lawanson Profile". nevadawolfpack.com. Retrieved August 21, 2012.
  5. Archive copy. Archived from the original on 2019-07-31. Retrieved on 2020-11-12.
  6. Àtụ:Cite Sports-Reference
  7. "Ruth Lawanson Profile". nevadawolfpack.com. Retrieved August 21, 2012.
  8. "Ruth Lawanson Profile". nevadawolfpack.com. Retrieved August 21, 2012.
  9. "Q&A With Nevada Volleyball Coach Ruth Lawanson On Her Olympic Experience". nevadawolfpack.com.