Ruth Tuma

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  Ruth Tuma (nwụrụ n'afọ 2016) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nkuzi nke Uganda nke jere ozi na nke asaa (2001 - 2006) na nke asatọ (2006 - 2011) Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda na-anọchite anya Jinja District.[1][2]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Tuna nwetara nzere Bachelors of Arts na Education na Masters' Degree of Education na Planning and Administration na Ugandan Christian University, Mukono.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ na Kyambogo National na Bishop Willis Teacher's Colleges.[1]

A maara Tuna maka ịkwado agụmakwụkwọ maka ụmụ agbọghọ na Busoga.[2][3] Ọ nyekwara ụmụ nwanyị ime obodo aka site n'inye ha mkpụrụ kọfị na unere.[2]

Tuma jere ozi dị ka onye omeiwu nke Jinja District site na 2001 ruo 2006.[2] N'oge Tuma nọ na nzuko omeiwu, ọ bụ onye isi oche nke Uganda Parliamentary Forum for Children na onye otu kọmitii ego na mmefu ego maka ndị omeiwu Uganda maka Global Action.[1] Ọ rụrụ ọrụ na ikike ndị ọzọ gụnyere ịbụ onye otu ndị nduzi, osote onye nnọchiteanya maka udo na ọchịchị onye kwuo uche ya na onye isi oche nke Federation of University Women of Africa.[1] N'afọ 2007, ọ rịọrọ maka nchebe ụmụaka pụọ na ndị na-emebi iwu mmekọahụ ma chọọ ka ndị omeiwu rụọ ọrụ dị ukwuu n'ichebe ikike mmadụ na ịlụso ịda ogbenye ọgụ.[4]

N'afọ puku abụọ na iri na isii , Agnes Nabirye meriri Tuma na ntuli aka nke National Resistance Movement.[2][5]

N'afọ 2016, ọ nwụrụ n'ọrịa kansa n'ụbọchị iri na atọ n'ọnwa Julaị n'ụlọ ọgwụ Kampala International Hospital mgbe ọ rịasịrị ọrịa kansa ọtụtụ ọnwa.[5] Tupu ọnwụ ya, e bugara ya South Africa maka nlekọta ahụike.[5] E liri Tuma n'ụlọ nna nna ya na mpaghara Namutumba.[1]

Ndụ onye[dezie | dezie ebe o si]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị otu nke asatọ nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Former Jinja district MP Ruth Tuma passes on (en). New Vision. Retrieved on 2022-03-24. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Jinja Former Legislator Succumbs to Cancer (en-US). ChimpReports (2016-07-14). Retrieved on 2022-03-24. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  3. Ruth Tuma (en-US). ChimpReports. Retrieved on 2022-03-27.
  4. Ugandan legislators urge funding for children in northern Uganda - Uganda (en). ReliefWeb. Retrieved on 2022-03-27.
  5. 5.0 5.1 5.2 Gulumaire. Former Jinja Woman MP Dead (en). Uganda Radio Network. Retrieved on 2022-03-27.Gulumaire, Andrew. "Former Jinja Woman MP Dead". Uganda Radio Network. Retrieved 2022-03-27. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content