Safiya Hussaini

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Safiya Hussaini
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereSafiya Dezie
aha ezinụlọ yaHussaini Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1967 Dezie

Safiya Hussaini Tungar Tudu onye amụrụ n'afọ 1967 bụ nwaanyị Nigerian a màrà ikpe ọnwụ n'ihi akwam iko Onye lụrụ di na 2002. Ọ mụrụ otu nwa na-alụghị di na Sokoto, steeti Naijiria nọ́ n'okpuru iwu Sharia . A mara ya ikpe ịtụ ya nkume, mana ewepụrụ ya na ebubo ya niile na Maachị 2002 ka emechara ya . Hussaini

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mara Hussaini ikpe ọnwụ itugbu ya na Ọktoba 2001 maka ebubo na ya na onye agbata obi ya lụrụ nwanyị dinara. Ọ mụrụ nwa ahụ mgbe ọ gbachara alụkwaghịm. Hussaini kwuru na nwoke ahụ bụ onye dakwasịrị ya n'ike ugboro ugboro, ndị ụlọ ikpe Sharia achọpụtaghị na ọ dara ikpe n'ihi enweghị akaebe. N'oge ikpe ahụ, Hussaini enweghị onye nnọchite iwu ọ bụla ma agwaghị ya ikike onwere [1] ụlọ ikpe Sokoto kpochapụrụ akaebe ya wee maa ya ikpe na 12 Ọktoba 2001.

Amamíkpé a bụ nke mba ụwa katọrọ ma dee akwụkwọ maka mgbapụta ya.Halima Abdullahi, onye ntụziaka nke otu abụghị nke gọọmenti hiwere bụ Help Eliminate Loneliness and Poverty(HELP) kwutọkwara amam ikpe a.N'okwu ya ọ sịrị na nke a bụ ihe ihere nyere otu Muslim nke Naịjirịa. Otú a kwuru na ikpe a ezighị ezi n'ihi amara Safiya ikpe onye nọ na di ma ọ gbala alukwaghịm . Nke ọzọkwa mmadụ anọ kwesịrị ịbụ ndị aka ebe dịka iwu Islam si dị bụ ndị ahughị .Halima kwuru na nke a bụ n'ihi enweghị ọnụ,ma kpọkwa nke a nkewa n'ógó dị elu enwere ebe nwoke na nwanyị nọ.Otua gara n'ihu ịkpọku Gọvanọ Attahiru Bafarawa ka ọ tiyee ọnụ n'izọpụta ndụ Safiya.

Hussaini rịọrọ, ndị ọka iwu ya na-arụ ụka na di mbụ nke Hussaini bụ nna nwa ya nwanyị dị otu afọ bụ Adama na nwanyị ahụ kwuru okwu mbụ ya n'okpuru nrụgide. [2] N'ịga n'ihu, ha rụrụ ụka na ịkwa iko a na-ebo ebubo ewerela ọnọdụ tupu etinye iwu Sharia na steeti ahụ. E guzobere iwu sharia zuru oke na Sokoto na Jun 2000, otu ọnwa ka amụchara Adama. [3] [4] Onye gbachitere ya bụ onye ọka iwu na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na Naịjirịa bụ Hauwa Ibrahim .

Hussaini meriri arịrịọ ya n'onwa Maachị 25, 2002 ma akagbuo ikpe ahụ. Ụlọ ikpe mkpegharị dị na Sokoto chọpụtara na ikpe ọnwụ nke ụlọ ikpe Alakụba kpere na Oktoba, enweghị isi. Ụlọ ikpe ahụ kpebiri na enweghị ike iji ihe ịkwa iko nke iwu Sharia nke Sokoto mee ihe ḿmegide nyere Safiya, ebe ọ bụ na ịkwa ikoa ana-ebo ebubo bụ tupu ewebata iwu Sharia na Sokoto. [5] [6]

Mkpesa Hussaini mèchàrà bụrụ ihe edekọrọ n'akwụkwọ akpọrọ, Safiya Hussaini Tungar Tudu: I, Safiya (2004).[7]

Hụ́ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Amina Lawal
  • Hauwa Ibrahim
  • Sharia in Nigeria

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. INSIDE AFRICA. Archived from the original on 2020-02-02. Retrieved on 2020-11-14.
  2. Nigerian Woman Avoids Stoning Death
  3. Safiya: "My crime is being a woman"
  4. Nigerian Woman Wins Reprieve from Stoning
  5. Safiya Hussaini
  6. Safiya Hussaini acquitted by Nigerian court
  7. "Safiya Hussaini Tungar Tudu: I, Safiya", 28 May 2004. Retrieved on 7 November 2011.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]