Sahel and Sahel Observatory

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

The Sahara and Sahel Observatory (French: Observatoire du Sahara et du Sahel, OSS) bụ òtù gọọmentị etiti Afrịka nke e guzobere n’afo 1992 ma dabere na Tunis, Tunisia. Ebumnuche ya bụ ichebe gburugburu ebe obibi na Sahara ya na Sahel, nyochaa ojiji nke ihe onwunwe okike na mpaghara ahụ, na itinye aka na nkwekọrịta gburugburu ebe obibi, ọkachasị ndị metụtara ọzara na mgbanwe ihu igwe. Ndị otu ahụ gụnyere mba iri abuo na abuo nke Afrịka, mba ise na-abụghị Afrịka (Canada, France, Germany, Italy ya na Switzerland), òtù mba ụwa iri (gụnyere ndị nnọchi anya mpaghara ise sitere na West, East na North Afrika) na otu nzukọ na-abụghị nke gọọmentị. Òtù ahụ nwetara €nde iri na asaa n'etiti afọ 2006 ruo na 2011.[1] N'ọnwa Eprel nke afo 2016, a họpụtara alaeze Morocco ka ọ bụrụ onye isi oche afọ anọ nke nzukọ ahụ.[2]

Ụfọdụ n'ime ọrụ OSS gụnyere Long Term Ecological Observatory (French: Réseau d'Observatoires de Surveillance Ecologique à long Terme, ROSELT), nke nwere ụlọ nyocha 25 ya na mba 12; usoro ịdọ aka ná ntị n'oge ọkọchị na Maghreb; na njikwa mmiri dị n'okpuru ala na Algeria, Libya na obodo Tunisia.[1]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Sahara and Sahel Observatory. World Meteorological Organisation (21 March 2013). Retrieved on 14 December 2016.
  2. Morocco Elected Chair of Sahara-Sahel Observatory. Lemag.ma (28 April 2016). Archived from the original on 29 April 2016. Retrieved on 14 December 2016.