Salamatu Hussaini Suleiman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Salamatu Hussaini Suleiman
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụArgungu Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
Ọkwá o jiMinister of Women Affairs and Social Development Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie

Salamatu Hussaini Suleiman bụ onye ọkaiwu Nigerian nke na-eje ozi ugbu a dị ka Kọmishọna ECOWAS n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, Udo na Nchekwa.[1] Tupu okwa a, a họpụtara ya dịka Mịnịsta na-ahụ maka Okwu Ndị Nwanyi na mmekọrịta ndị mmadu na ọha na Disemba 2008.[2] Ọ hapụrụ ọfis na Machị 2010 mgbe Onye isi ala Goodluck Jonathan gbanwere ụlọ ọrụ ya.[3]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Salamatu Hussaini Suleiman na Argungu, na-obodo na-azụ azu na Steeti Kebbi. Nna ya bụ onye ọka-ikpe na-ụlọ ikpe mpaghara, nne ya si n'ezinụlọ ọchịchị ama ama bụ Gwandu. A zụlitere ya na Birnin Kebbi na Argungu. Na 1972, o banyere ụlọ akwụkwọ nke Queens College, Lagos. Ọ gaara mahadum Ahmadu Bello, Zaria ebe ọ nwetara nzere na iwu. O mechara gaa Mahadum maka Economics na ọchịchị sayensị na London ebe o nwetara nzere mastas na mmuta iwu.[4]

Ọrụ mbụ ya dị ka onye ọkaiwu na Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe na steeti Sokoto nke ochie. O mechara rụọ ọrụ afọ asaa na Continental Merchant Bank, Lagos, ma rụọ ọrụ obere oge na NAL Merchant Bank tupu ọ gaa na Aluminium Smelter Companị, ebe ọ bụ odeakwụkwọ ụlọ ọrụ / onye na-enye ndụmọdụ iwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ na Securities & Exchange Commission tupu a họpụta ya Minista na Naijiria.

Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara ụmụ nwanyị[dezie | dezie ebe o si]

Onye isi ala Umaru Yar'Adua họpụtara Suleiman ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe metụtara ụmụ nwanyị na 17 Disemba 2008.[5] Na Septemba afọ 2009, Suleiman mere mkpesa na gọọmentị ekweghi ka ụmụnwaanyị sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. O kwuru na ime ihe ike na nwoke ịkpa-ike juru ebe niile na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, yana enweghị ego, mere ụmụ nwanyị ole na ole nwere ike ịzọ ọchịchị.[6] Na nzukọ a na-enwe na October 2009 nke UNICEF na Mịnịstrị ihe gbasara ụmụ nwaanyị haziri, Suleiman kwuru na ebumnuche ya bụ ije ozi dị ka ụgbọ-ala mba maka ọnọdụ na ọganihu na ahụike nke ụmụ nwanyị Naijiria, na iji hụ na nchekwa na ịzụlite nke ụmụ nwanyị na ụmụaka bara uru. Ọ gwara ndị steetị gọọmentị ka ha nye ụmụ nwanyị ohere na ihe ịzọ ọchịchị na nhọpụta, opekata mpe 30%.[7] Na onwa disamba, ọ mere mkpesa na gọọmentị ekwebeghi ka emepụta nkwekọrịta nke United Nations maka mkpochapụ ụdị niile nke ịkpa ókè megide ụmụ nwanyị (CEDAW)[8]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụkwa Họnọrable Minista nke steetị II n'ahu maka okwu mba ụwa na Naijiria, 2010 ruo 2011.

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. KPOGNON, Paul D. CEDEAO. Archived from the original on 2018-09-26. Retrieved on 2020-11-13.
  2. LAMBERT TYEM (May 11, 2009). I’m not a politician, but a technocrat –Salamatu Suleiman, Women Affairs Minister.
  3. Daniel Idonor (17 March 2010). Jonathan Sacks Ministers. Vanguard. Retrieved on 2010-04-14.
  4. LAMBERT TYEM (May 11, 2009). I’m not a politician, but a technocrat –Salamatu Suleiman, Women Affairs Minister.
  5. Anza Philips, Abuja Bureau (24 December 2008). The Coming of New Helmsmen. Newswatch. Retrieved on 2009-12-26.
  6. Damilola Oyedele (16 September 2009). Minister Decries Low Women Participation in Politics. This Day. Retrieved on 2009-12-26.
  7. George Okoh (19 October 2009). Tackling the Challenges of Child, Maternal Mortality. This Day. Retrieved on 2009-12-26.
  8. Damilola Oyedele (16 December 2009). How Have Women Fared in 2009?. This Day. Retrieved on 2009-12-26.