Sama Lukonde

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sama Lukonde
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịDemocratic Republic of the Congo Dezie
aha n'asụsụ obodoJean-Michel Sama Lukonde Dezie
Aha enyereJean-Michel Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Ọgọọst 1977 Dezie
Ebe ọmụmụParis Dezie
ŃnàStéphane Lukonde Kyenge Dezie
Ọrụ ọ na-arụinjinia Dezie
Ọkwá o jiPrime Minister of the Democratic Republic of the Congo, Minister of Youth Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversité de Lubumbashi Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịFuture of Congo Dezie
Sama Lukonde

Jean-Michel Sama Lukonde Kyenge (amụrụ n'ụbọchị nke anọ n"ọnwa Ọgọstụ nʼafọ 1977) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Congo si n "ógbè Katanga" nke bụbu praịm minista nke Democratic Republic of the Congo kemgbe ụbọchị iri na ise nke onwa Febrụwarị n'afọ 2021.[1] A kpọrọ ya ụbọchị ọdachi Osimiri Congo nke afọ 2021.[2] Ọ mara ọkwa kansụl ya n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Eprel afọ 2021.[3] Ọ bụ onye otu Future of Congo.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Lukonde na odeakwụkwọ nke United States Antony Blinken na nleta ha gara na Kinshasa n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2022.[4]

A mụrụ Lukonde n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1977, na Paris, ọ bụkwa onye nwetara ọzụzụ dị ka injinia .[5] Ọ bụ nwa Stéphane Lukonde Kyenge, onye dị mkpa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo ya Katanga bụ onye e gburu n'afọ 2001.[6]

Mgbe ọ na-arụsi ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka onye otu Avenir du Congo (English, Future of Congo), ma bụrụ otu n'ime ndị omebe iwu kachasị nta na National Assembly (Democratic Republic of the Congo) , a kpọrọ Lukonde Minista nke Ndị Ntorobịa, nke Egwuregwu, na Ntụrụndụ na ọnwa Disemba afọ 2014, n"oge ọchịchị Joseph Kabila .[6] Ọ rụrụ ọrụ n'ọkwa a ọnwa iri, tupu ọ gbaa arụkwaghịm iji kwado òtù pati ya na mmegide ha na Kabila maka oge nke atọ n"usoro dị ka onye isi ala.[6]

N'ọnwa June nke afọ 2019, Lukonde ghọrọ onye ndidi ọha nke Gécamines: otu n'ime nnukwu ụlọ ọrụ na-egwupụta ihe n"Afrika, na nke kachasị na Democratic Republic of Congo. Onye isi ala Félix Tshisekedi họpụtara ya n'ọkwa a n'onwa June afọ 2019.[7] Tupu ọ bụrụ onye isi nchịkwa nke Congo National Railway Company, SNCC.[8]

Tshisekedi họpụtara ya dịka praịm minista n'ọnwa Febụwarị nke afọ 2021.[9] O mechara gụọ ụlọ ọrụ ya aha.[10]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. DR Congo's Tshisekedi names new PM after power struggle (en). France 24 (15 February 2021). Retrieved on 16 February 2021.
  2. Congo River Disaster: Nine dead, Many Missing as Boat Capsizes Near DR Congo Capital (en). News18 (16 February 2021). Retrieved on 16 November 2021.
  3. DR Congo announces formation of new government (en-GB). DW.COM (12 April 2021). Retrieved on 21 April 2021.
  4. Secretary Blinken’s Travel to Cambodia, the Philippines, South Africa, the Democratic Republic of the Congo, and Rwanda (en). United States Department of State. Retrieved on 2022-08-21.
  5. RDC : Qui est le nouveau Premier Ministre Jean-Michel Sama Lukonde Kyenge ? - (fr-FR) (16 February 2021). Archived from the original on 30 October 2021. Retrieved on 13 April 2021.
  6. 6.0 6.1 6.2 DRC: Tshisekedi appoints Sama Lukonde Kyenge as new PM (en-US). The Africa Report.com (17 February 2021). Retrieved on 16 November 2021.
  7. AfricaNews (15 February 2021). Tshisekedi names Jean-Michel Sama Lukonde new DRC prime minister (en). Africanews. Retrieved on 30 April 2021.
  8. archyde. Jean-Michel Sama Lukonde appointed Prime Minister of the DRC (en-US). Retrieved on 30 April 2021.
  9. Congo president names new prime minister, increases control (en-US). Daily Herald (15 February 2021). Retrieved on 16 February 2021.
  10. archyde (15 February 2021). Jean-Michel Sama Lukonde appointed Prime Minister of the DRC (en-US). Archyde. Retrieved on 16 February 2021.

Àtụ:S-start

Àtụ:S-off Àtụ:S-bef Àtụ:S-ttl Àtụ:S-inc Àtụ:S-end