Samwel Mohochi
ụdịekere | nwoke |
---|---|
ụbọchị ọmụmụ ya | 26 Jụn 1972 |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-akwado ikike mmadụ, onye ọka iwu |
Samwel Mukira Mohochi (amụrụ n'ọnwa June n'ụbọchị iri abụọ na isii, afọ 1972 na Nairobi, Kenya) bụ onye Kenya na-ahụ maka ikike mmadụ na onye ọka iwu, nwere ahụmịhe iwu dị ukwuu na ikpe ikike mmadụ n'ụlọ ikpe mba. Ọ bụ onye na-akwado ikike mmadụ na mba ụwa n'ihu ndị na-ahụ maka nkwekọrịta na United Nations Human Rights Council.
Nkụzi mmalite
[dezie | dezie ebe o si]Samwel Mohochi gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ọha na eze na Kenya. Ọ gara Kimathi Estate Primary School n'agbata afọ 1980 rụọ afo 1985, Ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Rabai Road n'agbata afọ 1985 rụọ afọ 1987, ebe o ruru eru maka Asambodo ule izizi nke Kenya (KCPE). O mechara gaa St Paul's High School Amukura na Teso District n'agbata afọ 1988–1990 na Kisii High School n'agbata afọ 1990–1991, ebe o ruru eru maka asambodo Kenya Certificate of Secondary Education (KCSE).
Agụmakwụkwọ dị elu
[dezie | dezie ebe o si]Samwel Mohochi gụrụ akwụkwọ maka Bachelor of Laws Degree LLB na Babasaheb Dr. Ambedkar Law College, Nagpur University na India, n'agbata afọ 1992 rụọ afọ 1997; ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke abụọ.
O debara aha ya maka ule ọka iwu ya na Ụlọ akwụkwọ iwu Kenya n'afọ 1998, emesịa gụsịrị akwụkwọ na diplọma ya na iwu n'afọ 2000.
Ọ gụsịrị akwụkwọ na Masters na Law LLM na Transitional Justice Institute University of Ulster n'afọ 2009 rụọ afọ 2010 na edemede akpọrọ "Jurisdiction of the ICC: Realpolitik sitere na ndị otu steeti na Rome Statute na United Nations Security Council na arụmọrụ ya.
Ihe nrite na ihe ịga nke ọma
[dezie | dezie ebe o si]Front line Human Rights Defender Award Nominee n'afọ 2009.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- http://www.imlu.org/index.php?option=com_content&task=blogcategory&id=15&Itemid=29&limit=9&limitstart=9
- http://www.omct.org/index.php?menuId=97&lang=eng
- Reuters April 27, 2008
- http://www.frontlinedefenders.org/
- http://www.unog.ch/80256EDD006B9C2E/(httpNewsByYear_en)/A80BB210F356BF46C12575CA0040E40E?OpenDocument/
- https://web.archive.org/web/20160404111142/http://www.legalservicesplc.org/index.php/our-people/57-samwel-mohochi-managing-partner
- http://ke.linkedin.com/pub/samwel-mohochi/3/9b1/422