Sandra Mitchell (UNRWA)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sandra Mitchell (UNRWA)
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereSandra Dezie
aha ezinụlọ yaMitchell Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1962 Dezie
onye were ọrụMba Ndị Dị n'Otu Dezie

A họpụtara Sandra Mitchell ka ọ bụrụ osote Kọmishọna General nke otu United Nations Relief and Works Agency for Palestine Refugees in the Near East (UNRWA) site na afọ 2014 ruo na afọ 2020 mgbe arụchara nkwekọrịta ya n'ụzọ zuru ezu[1]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupu nhọpụta ya na 31 Disemba na afọ 2014, Ms. Mitchell rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi oche nke mmemme mba ụwa nke Kọmitii Nnapụta Mba Nile (IRC). Site na afọ 2011 ruo na afọ 2013, ọ nọ n'ọkwá dị elu na UNRWA. Tupu nke ahụ, ọ rụrụ ọrụ na otu United Nations Di na obodo Kosovo dị ka Chief Humanitarian Officer. Na mgbakwunye na ịrụ ọrụ n'ọhịa nke idebe udo nke mba ụwa, Ms. Mitchell nwere ọtụtụ afọ nke ahụmịhe n'ọgbọ iwu, yana òtù mba ụwa dị ka otu Organization for Security and Cooperation in Europe. Site na afo 2002 ruo na afọ 2004, ọ nọ n'ọkwa osote onye isi oche maka mmekọrịta gọọmentị na nkwado na IRC.

N'afọ 2019, Mitchell so n'ime ndị isi na-ekwu maka akụkọ otu UN na-ekwu na ha na-eme ihe ọjọọ na mmegbu na UNRWA; akụkọ ahụ gbasara ụlọ ozi Al Jazeera. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, Mitchell na-ekwu ugboro abụọ na afọ 2018 gbalịrị inweta nkwalite maka di ya. Mitchell gọnahụrụ nkwupụta Al Jazeera.[2]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]