Sandra Ndebele

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Sandra Ndebele
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereSandra Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Jenụwarị 1982 Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye egwu, Ọgba egwu Dezie
ebe agụmakwụkwọMpopoma High School Dezie

Sandra Ndebele bụ onye egwu Zimbabwe, onye na-agba egwu na onye na-eme ihe nkiri.

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Sandra na Bulawayo n'abalị 3 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982. Ọ biri na mpaghara dị elu nke Tshabalala na Nkulumane. Ọ gakwara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Founders ọ bụ ezie na a zụlitere nkà egwu ya site na Inkululeko Yabatsha School of Arts, IYASA.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Sandra malitere isonye na nka mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ ma mesịa sonye n'òtù IYASA nke ya na ya gara ụwa. O mechara wepụta egwu 10 nke abọm ya n'onwe ya n'afọ 2003. Ọ gara n'ihu na-eme ihe omume dị iche iche ya na ndị omenkà ka Oliver Mtukudzi na Alick Macheso. Afọ 2003 bụkwa afọ ọ meriri 3 Awards na Zimbabwe Music Awards.[1] Egwú ya dị elu mere ka ọtụtụ ndị mara ya ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere nchegbu na ya na-ekwu na ịgba egwú ya na-akpali agụụ mmekọahụ ma na-akpasu iwe.[2] Ndị na-agụ egwú ya, Malaika na Mama bụ ndị ọkacha mmasị ya. Ọ gara n'ihu wepụta ọtụtụ egwu na abọm ndị ọzọ. Ọ gbanwere aha ya n'afọ 2019 wee chọọ ndị na-agba egwú ọhụrụ ka ha sonye n'òtù ya ka ọ na-akwadebe maka abọm ọhụrụ.[3] Kemgbe ọtụtụ afọ Ndebele esorowo ndị egwu dị iche iche rụkọọ ọrụ gụnyere Jah Prayzah na abụ ịhụnanya a na-akpọ Mushona neMuNdevere .[4] Ya na ndị dịka Ammara Brown, Sulumani Chimbetu na Somandla Ndebele rụkọkwara ọrụ. N'oge na-adịbeghị anya, a kọrọ na Sandra Ndebele ga-eme ihe nkiri Netflix, The Bad Bishop nke a ga-eme na South Africa.[5]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Sandra lụrụ Nkanyiso Mbusi Sibindi onye ọ lụrụ n'afọ 2011 ma ha nwere ụmụ atọ.

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sandra Ndebele (fr). Music In Africa (2015-07-03). Retrieved on 2021-12-04.
  2. "Raunchy dance to sell Zimbabwe culture", 2007-01-24. Retrieved on 2021-12-03. (in en-GB)
  3. Sandra Ndebele hints at comeback (en-US). The Standard (2016-02-21). Archived from the original on 2021-12-03. Retrieved on 2021-12-03.
  4. Chronicle. Jah Prayzah, Sandra collaborate (en-GB). The Chronicle. Retrieved on 2021-12-03.
  5. Sandra Ndebele, Madam Boss To Star In SA Netflix Movie (en-GB). NewZimbabwe.com (2021-07-23). Retrieved on 2021-12-03.