Sandra Suubi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sandra Suubi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereSandra Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1990 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Dezie

Sandra Suubi (amụrụ n'afọ 1990) bụ onye na-agụ egwú gospel na onye na-ese ihe nkiri na Uganda.[1][2][3][4][5]

Afọ ndị mbụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Suubi na Kampala, Uganda na afọ 1990. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Greenhill Academy na agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Gayaza High School, ma na Kampala.[6] Ọ gara Mahadum Makerere ebe ọ nwetara nzere bachelọ na Fine Arts site na Margaret Trowell School of Industrial and Fine Art. Na Jenụwarị, na afọ 2018, ọ gụsịrị akwụkwọ n'otu Mahadum ahụ na nzere masta na Fine Arts.[7][8][1][2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Suubi so n'òtù ukwe ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ malitere ọrụ ya dị ka onye na-agụ egwú na afọ 2011 mgbe ọ sonyeere otu ụmụ agbọghọ a na-akpọ Xabu n'okpuru nduzi nke First Love . Ya na otu ahụ, ọ malitere ịrụ ọrụ na ihe omume dị iche iche mgbe ọ nọ na mahadum. N'afọ 2015, otu ahụ kewara, ya mere ọ sonyeere asọmpi Airtel Trace Music wee merie. Ọ gara n'ihu na-anọchite anya Uganda na mpaghara East Africa na ọkwa mba ụwa nke asọmpi ahụ.[9] O weputara abọm izizi ya na afo 2016 nke gosipụtara egwu abụọ, Togwamu Suubi na Nsiimye[4][10] . Egwú ya, Togwamu Subi gosipụtara dị ka egwu egwu maka ihe nkiri Veronica10 Wish na afọ 2018. O weputara abọm nke abuo ya na afo 2018 na abọm a gosipụtara egwu dika Onjagande nyo, Kingdom come, Heaven na Jangu Tuzine[9][11].

Ewezuga egwu, Suubi na-arụ ọrụ dị ka onye na-ese ihe na gburugburu ebe obibi. Ọ na-emegharị ihe mkpofu plastik iji mepụta nrụnye, ihe ndị na-ada n'azụ ihe nkiri, ọla na ihe ịchọ mma ụlọ. Ọrụ nka ya egosila na mmemme nka Kampala dị iche iche dị ka Bayimba na afọ 2013 back drop, laba na afọ 2014 Headphones, Bodaboda Helmet na echiche nke nnụnụ n'oge nka Kampala.[4][11]

Nkọwapụta[dezie | dezie ebe o si]

  • Abụ nke Ndụ (2016)
  • Anthems of Life, Ep (2018)
  • Faya

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

  • O meriri Best New Artiste nke afọ 2015 - Victoria Gospel Academy (VIGA) awards[5]
  • O meriri na Upcoming Female Artist of the year 2016 - VIGA Awards[8]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 MORNING AT NTV: Christmas Carols with Sandra Suubi - Features | NTV. www.ntv.co.ug. Retrieved on 2019-12-30.
  2. 2.0 2.1 Award Winning Artiste, Sandra Suubi Graduates With a Masters Degree (en-US). Campus Bee (2018-01-23). Retrieved on 2019-12-30.
  3. Sandra Suubi – African Crossroads (en-US). Retrieved on 2019-12-30.
  4. 4.0 4.1 4.2 Sandra Suubi | A featured Artist and Performer at the Diaspora 2015 Gala | Welcome to the Ugandan Diaspora (en-US). Archived from the original on 2022-10-02. Retrieved on 2019-12-30.
  5. 5.0 5.1 Kaggwa. Sandra Suubi on balancing art and music (en-gb). The Observer - Uganda. Retrieved on 2019-12-30.
  6. Nantaba (2018-05-03). Uganda: Sandra Suubi Mixes Music and Art (en). allAfrica.com. Retrieved on 2019-12-30.
  7. Sandra Suubi (en-GB). AtWork. Retrieved on 2019-12-30.
  8. 8.0 8.1 Sandra Suubi accorded a master's degrees from Makerere (en-US). UG Christian News (2018-01-19). Retrieved on 2019-12-30.
  9. 9.0 9.1 Sandra Suubi (en-GB). Bayimba International Festival (2019-07-22). Archived from the original on 2019-12-30. Retrieved on 2019-12-30.
  10. Sandra Suubi finally releases a debut song. New Vision (2016-11-01). Retrieved on 2019-12-30.
  11. 11.0 11.1 Sandra Suubi (en). Music In Africa (2019-05-03). Retrieved on 2019-12-30.