Sani Ndanusa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sani Ndanusa
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Mee 1957 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Youth and Sports Dezie
ebe agụmakwụkwọLoughborough University Dezie

</ref>

Sani Ndanusa nwetara asambodo ndị bekee kpọrọ MSc na Waste na Water Engineering na MahadumLoughborough, United Kingdom. Ọ bụ onye isi nchịkwa ndị isi nke bọọdụ mmiri ndị Niger State Water Board (site na 1999 ruo 2001), wee bụrụ onye ode akwụkwọ na-adịgide adịgide nke bọọdụ a. [1] N'ọnwa Disemba afo 2003, o kwuputara na bọọdụ mmiri a ga-akpọ ọkọnọ mmiri oñụñụ mkpa, kwụpụ ndị n'akpu aja eji arụ ụlo, ndị na-asacha ụgbọ ala yana ndị n'akọ ifuru n'ebe oburu ibu. Ndị azụmahịa ahụ aghaghị ịchọta ebe ndị ọzọ ha ga-esi nweta mmiri. [2]

A họpụtara ya ka Kọmishọna Na-ahụ maka njem na mmepe akụrụngwa dị iche iche. N’otu oge ahụ, ọ bụ onye osote onye isi ala nke Tennis Federation nke Naijiria (NTF) ruo afọ anọ, a họpụta ya ka ọ bụrụ onye isi NTF n’afọ 2001 Ọ bụkwa onye isi oche nke Kọmitii Olympic nke Obodo Naijiria n'afo 2008.. [1] A họpụtara Ndanusa dịka osote onye isi nke Njikọta Egwuregwu Tennis nke mba Afrịka n'ọnwa Eprel afo 2003 ma hoputakwa ya n'afo 2007. [3]

Onye isi ala bụ Umaru Yar'Adua họpụtara ya dịka Onye Ozi nke Ntorobịa, Egwuregwu na mmepe mmekọrịta mmadụ na ibe ya na onye isi oche ọrụ egwuregwu mba Naijiria n'ọnwa Disemba afo 2008. [4] N'ọnwa Nọvemba afọ 2009, enwere esemokwu mgbe ndị Olympic kọmittii nke Naijiria (NOC) ekweghị ka Sani Ndanusa bụrụ onye a họpụtara ịbụ onye isi oche nke NOC N'ọnwa Disemba 2009, Sani Ndanusa ñụrụ iyi na Naịjirịa ga-eziga ọrụ kacha mma site na mba Africa na 2010 Commonwealth Games N'ọnwa Disemba 2009, Sani Ndanusa ñụrụ iyi na Naịjirịa ga-eziga ọrụ kacha mma site na mba Africa na New Delhi . [5]

Ntụgharị[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 Nigeria:The Man, Ndanusa. Vanguard (Lagos) (18 December 2008). Retrieved on 2009-12-25.
  2. Sani Ndanusa, Niger State Water Board, Nigeria. This Day (28 Dec 2003). Archived from the original on 2013-02-22. Retrieved on 2009-12-25.
  3. NTF Faults NOC On Ndanusa. Leadership (19 November 2009). Retrieved on 2009-12-25.
  4. John Egbokhan (18 December 2008). Ndanusa is New Sports Minister. Vanguard. Retrieved on 2009-12-25.
  5. Fidelis Ebu (16 December 2009). New Delhi 2010 - Ndanusa Says Nigeria Will Be Continent's Best. Vanguard. Retrieved on 2009-12-25.