Shettima Mustapha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Shettima Mustapha
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Novemba 1939 Dezie
Ebe ọmụmụNguru Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2022 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Defence of Nigeria, Minister of Agriculture and Rural Development, Minister of Interior Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Cambridge, Purdue University, Mahadum Ahmadu Bello Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party, Nigerian People's Party Dezie

Shettima Mustafa' OFR (amụrụ n'ụbọchị iri abụọ n'isi nke ọnwa Nọvemba afọ 1939 - Novemba 2022) bụ Nwa-afọ Naịjirịa gụrụ akwụkwọ na onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ dị ka Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ugbo (1990–1992), n'afo 2007 ka a họpụtara Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa n'ime Kabịnetị nke Onye isi ala Umaru Yar'Adua . O mechara bụrụ Mịnịsta nke ime obodo. [1] Ọ hapụrụ ụlọ ọrụ n'ọnwa Maachị nke afọ 2010 mgbe Onye isi ala Goodluck Jonathan gbasoro ụlọ ọrụ ya. [2]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Shettima Mustafa n'ụbọchị iri abụọ n'isii nke ọnwa Nọvemba afọ 1939 na Nguru, nke dị na Yobe Steeti ugbua. Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke Borno na Maiduguri (1946–1952). Ọ zụrụ onwe ya dịka onye enyemaka ngalaba ahụike na Kano (1955–1956). Ọ rụrụ ọrụ na Nwa-afọ nchịkwa Borno (1954–1964) ma mesịa soro igwe redio na igwe onyonyo telivishọn nke Kaduna (1965–1967). N’afọ 1967, mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na asatọ, a nabatara ya na Mahadum Ahmadu Bello, gụchaa akwụkwọ n’afọ 1972 ma mesịa rụọ ọrụ dịka onye nyocha na ụlọ mmụta nke nyocha ọrụ ugbo na mahadum ahụ. Site n'afọ 1973 rue 1974, ọ gara Mahadum Cambridge, ebe o nwetara nzere diplọma nke ngụcha akwụkwọ na Bayọlọji etinyere. Ọ gara n'ihu ịgba mbọ nweta nzere PhD, na-ịgaMahadum Purdue, Indiana na United States n'afọ 1978, wee nweta nzere PhD n'afọ 1979. [3] O mechakwara ihe omumu na oru nlekọta na nyocha oru ugbo na Mahadum East Anglia n'afọ 1990.

Ọrụ ọha[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Shettima Mustafa dịka kọmishọna na ọchịchị gọọmenti Borno Steeti n’okpuru gọvanọ Mohammed Goni . [3] O biliri nwayọ n'ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ onye na-azọ osote onyeisiala nke pati ndị Naịjirịa na ntuli aka nke afọ 1983. Agbanyeghị, onye ọchịchị bụ Shehu Shagari nke National Party of Nigeria (NPN) meriri ntuli aka ahụ. [4] Mgbe nkwatu ọchịchị nke ndị agha nke ọnwa Desemba afo 1983 mgbe Major General Muhammadu Buhari banyere n'ọchịchị, a tụrụ ya mkpọrọ ruo 1985. Mgbe a hapụrụ ya ọ laghachiri nkuzi oge nwa oge na Mahadum Maiduguri. Ọ mechara bụrụ onye isi mpaghara na Jos nke Ụlọ ozi ọrụ ugbo Gọọmenti etiti. [3] Ka ọnwa nke asatọ dị n’afọ 1990, a họpụtara Shettima Mustafa dịka Mịnịsta na-ahụ maka Ọrụ Ugbo na Akụrụngwa efu, ojidere ọkwa ahụ ruo mgbe ndị omebe iwu kewara na 1992 [4]

Site na nke a, ọ buru onye ndụmọdụ nye òtù dị iche iche nke obodo na mba dị iche iche, wee bụrụ onye nlekọta ego nke mba nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP), ọkwá ọ nọrọ n'agbata afọ 1998 na 2001. Ọ bụrụ onye otu nke Otu Genetic nke Naịjirịa, onye otu Otu ịkọ ọrụ ugbo nke Amerịka na onye otu Ọrụ ugbo nke Naịjiria, N'afọ 2002, a họpụtara Shettima Mustafa na kọmitii nke Ụlọ akụ Savannah, n'agbanyeghị na O soghi nwere ụlọ ọrụ ahụ . [5]

Kabịnet Yar'Adua[dezie | dezie ebe o si]

Onye isi ala Umaru Yar'Adua họpụtara Shettima Mustafa dị ka Minista na-ahụ maka Nchekwa Naịjirịa . [6] N'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị afọ 2008, ya na Godwin Abbe gbanwere ọnọdụ, O wee bụrụ Mịnịsta nke ime obodo. [7]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. New Nigerian ministers nominated. Al Jazeera (18 November 2008). Retrieved on 16 December 2009.
  2. Daniel Idonor (17 March 2010). Jonathan Sacks Ministers. Vanguard. Retrieved on 14 April 2010.
  3. 3.0 3.1 3.2 Our People – Dr. Shettima Mustafa (OFR). Youth for Technology Foundation. Retrieved on 16 December 2009.
  4. 4.0 4.1 Rigorous Scrutiny for Ministerial Nominees. ThisDay (17 November 2008). Retrieved on 16 December 2009.
  5. Ernest Sofoluwe (6 May 2002). CBN Vs Savannah Bank: CUI Bono?. ThisDay. Archived from the original on 26 November 2005. Retrieved on 16 December 2009.
  6. Yar'Adua names cabinet. Africa News (27 July 2007). Archived from the original on 28 September 2011. Retrieved on 15 December 2009.
  7. Daniel Idonor (14 July 2009). Cabinet Shake-up : Yar'Adua moves Godwin Abbe to Defence Ministry. Vanguard. Retrieved on 7 December 2009.