Sidi Brahim (mmanya)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Na Sidi Brahim rosé

Sidi Brahim bụ ụdị mmanya a na-emepụta n'ugwu Atlas, nke mbụ na obodo Algeria, mgbe ahụ na obodo Morocco na ugbu a na obodo Tunisia. A na-agwakọta mmanya ahụ ma tinye ya na karama maọbụ jupụta n'ime akpa na France, a na-erekwa ya ebe ahụ. Ọ bụ mmanya nke abụọ kachasị ere na obodo France, n'azụ Boulaouane (nke bụkwa akara Castel), ka ọ na-erule afọ 2005. Ọnụ ọgụgụ mmepụta bụ ihe dịka nde karama atọ kwa afọ.[1] A gụrụ mmanya ahụ aha mgbe Agha Sidi-Brahim (1845).

Ọ bụ Groupe Castel nwe akara ahụ ugbu a, nke nwetara ya (na Malesan) na afo 2003 site na William Pitters, ụlọ ọrụ nke Bernard Magrez guzobere. Magrez/Pitters zụrụ ya na afo 1982. Akara nke karama mmanya na-acha ọbara ọbara na-ekwu na a "eji aka ewepụta ya kemgbe afo 1924".

Ihe mejupụtara mkpụrụ vaịn nke Sidi Brahim na ụdị mmanya dị iche iche a na-enye agbanweela kemgbe ọtụtụ afọ, mana na afo 2010 a na-egosi ihe mejupụtara ya dịka ihe ndị a:

  • Mmanya uhie: Cabernet Sauvignon (50%), Syrah (30%), na Merlot (20%).
  • Mmanya Rosé: Cinsault (40%) na Grenache gris (60%).
  • Mmanya ọcha: Chardonnay (100%).

Ngwakọta nke mmanya na-acha ọbara ọbara gụnyere ụdị ọdịnala nke North Afrika (nke ya na Languedoc-Roussillon na-ekerịta), dịka Alicante, Aramon, Carignan, Cinsault, na Grenache. Ihe mejupụtara ugbu a bụ "New World-like".

Hụkwazi[dezie | dezie ebe o si]

  • Mmanya Algeria

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "China and Russia are my priorities" (interview with Pierre Castel), Sud-Ouest Blogs/Bordeaux Wine News 2009-04-21