Gaa na ọdịnaya

Sierra (ụgbọ mmiri nwere injin)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sierra (ụgbọ mmiri nwere injin)
motor ship
Oge/afọ mmalite1916 Dezie
Mba/obodoNjikota Obodo Amerika Dezie
Dị na ngalaba nhazi mpagharaAberdeen Dezie
Nhazi ọnọdụ46°58′31″N 123°48′2″W Dezie
Nhọpụta nketaNational Register of Historic Places listed place Dezie
Map

Sierra bụ ụgbọ mmiri nwere akụkọ ihe mere eme nke a na-eji ebu osisi. E wuru ya n’afo 1916, a gbakwunyere ya na National Register of Historic Places n’afo 1978.

Akụkọ ihe mere eme

[dezie | dezie ebe o si]

E wuru Sierra na Matthews shipyard na Hoquiam maka E. K. Wood Lumber Company ma bụrụ ụgbọ mmiri mbụ e wuru na Grays Harbor.[1][2][3] Bolinder rụrụ injin ụgbọ mmiri ahụ na obodo Sweden, nke zigara onye nnọchi anya ka ọ lekọta nrụnye ha.[4] Senator Miles Poindexter gara mgbe a malitere ụgbọ mmiri ahụ n’ Ogust 30, n’afo 1916.[5]

Njem mbụ ya dịSkiwa ogologo bụ Valparaíso, nke obodo Chile.[2]Sierra nwere ike mezue njem na-agagharị na-enweghị mmanụ.

A na-eji Sierra ebugharị osisi n'etiti Bellingham, Washington na Hoquiam, Washington. N'ime otu ọnwa n’afo 1920, Sierra buuru mbupu nke 1,200,000 ụkwụ osisi site na Bellingham.[6]

Na Febụwarị 7, n’afo 1923, Sierra mebiri nke ukwuu mgbe ya na ụgbọ mmiri Wilhemina kụrụ n'oké alụlụ dị nso na San Francisco; e mere atụmatụ na mmebi buzikwa $ 135,000.

Mgbe afo 1926, Sierra gbara ọkụ na Berth 77 na ọdụ ụgbọ mmiri nke obodo Los Angeles, ọkụ mbụ nke ụgbọ mmiri ọkụ Los Angeles City No. 2 lụsoro.[7]

E rere Sierra n’afo 1927 ma tinye ya na ihe eji eme friji iji buru anụ reindeer site na Alaska maka ụlọ ọrụ ụgbọ njem Arctic.[8] N'oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị agha US na-arụ ọrụ Sierra dịka ụgbọ ọzụzụ. Mgbe agha ahụ gasịrị, e kenyere Sierra na Maritime Commission na Olympia, Washington, ma mesịa ree ya ma nyefee ya ndi otu Lake Union.[8]

Mgbe afọ 1964, onye nwe ụlọ ọhụrụ ahụ malitere iweghachi Sierra na nhazi mbụ ya, nke bu ibu osisi.

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "On the Shores of Grays Harbor". Pacific Marine Review. 16. 1919.
  2. 1 2 Motorship. Miller Freeman. 1921.
  3. ↑ "Hoquiam". Anacortes American. 14 Sep 1916. p. 6.
  4. ↑ "Machinery Arrives for the Steamer Sierra". Aberdeen Herald. 8 Sep 1916. p. 8. Retrieved 16 Nov 2019.
  5. ↑ "Lumber Town for Poindexter". The Seattle Star. 31 Aug 1916. p. 8.
  6. ↑ "Bellingham". The Timberman. 21. March 1920.
  7. ↑ "South Bay History: Fireboat No. 2, the Ralph J. Scott, served the Port of Los Angeles with distinction for 78 years". Daily Breeze (in Bekee ndị America). 2019-05-20. Retrieved 2019-11-16.
  8. 1 2 The H.W. McCurdy marine history of the Pacific Northwest, 1966-1976. McCurdy, H. W. (Horace Winslow), 1899-1989., Newell, Gordon R., Seattle Historical Society. Seattle: Superior Pub. Co. 1977. pp. 387–388, 546, 554. ISBN 0875642209. OCLC 2646126.{{cite book}}: CS1 maint: others (link)