Jump to content

Sika Wo Ntaban (ihe owuwu)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nke a bụ onyinyo nke akwa eji eme ihe site na aha Sika Ntaban ma ọ bụ Air Afrique. Ọ bụ VLISCO na Akosombo Textiles Limited (ATL) bipụtara ya na Ghana.

Sika Won Ntaban bụ aha Ghana nyere ákwà mbiputara a na-ahụ na Ghana, Togo na Nigeria. Ụlọ ọrụ Ghana Textiles Company (GTP) na-emepụta ákwà a n'okpuru VLISCO na Akosombo Industrial Company Limited nke a na-akpọbu Akosombo Textiles Limited (ATL) .

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

Aha a Ghana nyere ya pụtara na nsụgharị ya n'asụsụ Bekee dị ka 'Ego nwere nku' ma ọ bụ 'Ego pụrụ ife dị ka Nnụnụ'.[1] A gbazitere aha a site n'otu ilu Ghana nke a kọwara dị ka ego abụghị nke na-adịgide adịgide ma nwee ike ịtufu ya ma ọ bụrụ na ejighi ya nke ọma.[2] A maara ákwà ahụ dị ka Speed Bird (Nnụnụ ọgbọsọ) na Bekee.[2]

Nhazi maọbu Ịchọ mma Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ihe ndị e ji emepụta ákwà ahụ eji chọọ ya mma gụnyere ihe motif nwere ụ̀chá nweekwa akara laịnị ya na nnụnụ na-efe efe esere na ndabere dị larịị ma ọ bụ nke nwere ụ̀chá di n'ọdịdị dị kpụrụkpụrụ [citation needed] Ihe osise motif a nwere ụ̀chá na-abịa n'ụdị ụ̀chá dịgasị iche iche dị ka acha anụnụ anụnụ, odo odo na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ebe ndabere nnụnụ ahụ esere na-acha n'ụdị jikọdoro uhie uhie, ọcha ọcha na odo odo. [3] [4][5]

Aha Ya ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Eji aha ndị ọzọ mara ákwà ahụ na mba ndị ọzọ dị n'Afrịka. A maara ya dịka Air Afrique na Togo n'ihi na a na-eji ya dị ka ejiji nke ótù ụlọ ọrụ ụgbọ elu dị n'ógbè ahụ.[2] Na Naijiria, eji aha Igbo Eneke nke pụtara na ọ bụrụ na ndị na-achụ nta amụtala nkà nke ịgba égbè n'ụzọ ziri ezi mgbe ahụ nnụnụ ga-amụta nkà nke ife efe n'ebesaghị ebesa wee mara ya. [2] [6][7]

Ojiji ákwà a[dezie | dezie ebe o si]

A na-eji akwa a eme uwe nakwa ime ihe ndị onwe onye dị ka akwa isi na akpa a na-etinye ihe ntecha. [3][8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Story 'Rich today, poor tomorrow' about H524 (en). Vlisco Stories. Retrieved on 2023-03-01.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Speed Bird | Vlisco African / Ankara fabric names (en-US). Vlisco. Retrieved on 2023-03-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 Speed Bird African Wax Print SCARF /hand Made in Usa/head - Etsy (en-US). www.etsy.com. Retrieved on 2023-03-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  4. African Holland Wax/per Yard /speed Bird/ African Wax Print/ - Etsy (en-US). www.etsy.com. Retrieved on 2023-03-01.
  5. Speed Bird | Vlisco African / Ankara fabric names | African print fabric, Vlisco, African wax print (en). Pinterest. Retrieved on 2023-03-01.
  6. AYEEKO. African Print: 54 African wax print and story behind their names (en). AYEEKO. Retrieved on 2023-03-01.
  7. African Wax Prints and the Story behind their names - Rafarazzi African Couture (en-US) (2020-08-08). Retrieved on 2023-03-01.
  8. "Speed bird blue" make-up kit (en). Afrikrea. Retrieved on 2023-03-01.