Sinatu Ojikutu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sinatu Ojikutu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1946 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ekiti Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Alhaja Sinatu Aderoju Ojikutu bụbu osote gọvanọ Legọs steeti site n'afo 1992 ruo 1993. [1] [2] Ọ bụ osote gọvanọ Michael Otedola ruo mgbe ndị agha weghara ọchịchị n'afọ 1993. [3]

Ndụ mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Alhaja Sinatu Ojikutu na steeti Ekiti, ebe ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị ya. Ọ hapụrụ Ekiti ka ọ gachara akwụkwọ praịmarị isii gawa Legọs. Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Our Lady of Apostle dị n'Ijebu Ode . Site n'ụlọ akwụkwọ Our Lady of Apostle, ọ gara ụlọ akwụkwọ Grammar Ilesha ka ọ gụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye isi ụlọ ọrụ na Nigerian Bank for Commerce and Industry. Ọ bụ nwanyị mbụ a họpụtara n'ọkwa dị otú ahụ. Ọ bụ odeakwụkwọ ụlọ ọrụ na-ahụ maka njem na steeti Legọs. Sir Michael Otedola họpụtara ya dị ka onye ga-eso zọọ ọchịchị n'okpuru nche anwụ National Republican Convention o wee bụrụ osote gọvanọ Legọs steeti ka ha nwesịrị mmeri na ntuliaka n'afọ 1992. [5] Mgbe ndị agha kwagidere ọchịchị n’afọ 1993, e wepụrụ ha n’ọkwa. [6]

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2013, eboro Alhaja Jinatu na nwa ya nwoke, Samson ebubo na ha nara otu nwoke nde naira 130 maka otu ala dị n'akụkụ Admiralty Way na Lekki, Lagos State n'anya ọcha . E rere ala ahụ nye otu nwoke na-amaghị aha ya bụ onye kwụrụ ego ahụ n'akaụntụ ya naanị ka ọ chọpụta na ala ahụ bụ nke otu Mazị Afolabi. Dịka nkwupụta ndị uwe ojii siri kwuo, ọ kwetara mpụ ahụ mana o kwuputara na ọ bụ ezigbo mmejọ nke njirimara nkata. Ọ kwụghachiri onye ahụ gbara akwụkwọ nde naira iri ise ma kwe nkwa ịkwụghachi ya mgbe ọ tụfuru ngwongwo ya abụọ o debere ere. [7] N'ajụjụ ọnụ ya na The Punch gbara, o kwuru na ala ahụ bụ nke di ya nwụrụ anwụ. [8]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Olumide. "I’m not pleased with pace of development in Nigeria, says Ojikutu", Guardian, 2 October 2019. Retrieved on 21 November 2020.
  2. Olafusi. "Governors before 1999 didn’t benefit from Lagos pension package, says ex-deputy gov", The Cable, 15 November 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  3. Anonymous. "Sinatu Ojikutu: My life, career, relationship with IBB, Abiola, Otedola", Vanguard, 15 May 2019. Retrieved on 21 November 2020.
  4. Anonymous. "Sinatu Ojikutu: My life, career, relationship with IBB, Abiola, Otedola", Vanguard, 15 May 2019. Retrieved on 21 November 2020.
  5. Lawal. "I did not benefit from pension package Sanwo-Olu wants to scrap, says former deputy gov Ojikutu", Legit, 13 November 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  6. Marcus. "Why there’s always friction between govs, deputies – Sinatu Ojikutu", Punch, 5 May 2019. Retrieved on 21 November 2020.
  7. Ezeamalu. "Update: How ex-Lagos deputy governor duped man of N130mn, police say; declare her wanted", Premium Times, 19 June 2013. Retrieved on 21 November 2020.
  8. Marcus. "Why there’s always friction between govs, deputies – Sinatu Ojikutu", Punch, 5 May 2019. Retrieved on 21 November 2020.