Sorakiss

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sorakiss
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1994 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2018 Dezie

Barbara Martha Psorakis (onye amụrụ n'abalị iri na otu nke Eprel afọ 1996), nke aha otutu nkwago ya bụ Sorakiss, bụ onye Ghana na-agụ egwu na onye na-eme ihe nkiri.[1][2] N'afọ 2017, a họpụtara ya maka Best New Act na Ghana Entertainment Awards (USA) nke Medikal meriri.[3]

Agụmakwụkwọ na mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Sorakiss na Tema nye Mr George Psorakis na Madam Elizabeth Frimpong . O debara aha na Ola Senior High School maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya mana o mechara tụgharịa gawa Datus International School ebe ọ gụsịrị. Ọ gara n'ihu na-achụso ọrụ odide ihe n'egosi n'igbe onyonyo na ọrụ nduzi yaS na National Film and Television Institute (NAFTI).[4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Maka Sorakiss, ọrụ ya na egwu malitere mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. O dere egwu mbụ ya nke akpọrọ "No Pain No gain" nke nyere ya ohere ịme ihe nkiri na ụlọ omume Ihe nkiri mba nke Ghana.O nwekwara egwu abụọ na ihe nkiri abụọ "Hell Bound' & "Teens Life" nke tinyere aka na mbupute aha ya.

Egwu ya ọzọ, 'My Honey', nke gosipụtara Akwaboah Jnr nyere ya ohere ịme ihe n'oge dị iche iche gụnyere 4syte TV Music Video Awards na Ghana DJ Awards Ọ sonyeere 4stye TV dị ka onye na-eme ihe ngosi TV n'afọ 2014.[5][6]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Where is Sorakiss’s honey?. www.graphic.com.gh. Retrieved on 2019-07-08.
  2. Sorakiss eyes multiple awards in 2018 (en). www.ghanaweb.com. Retrieved on 2019-07-08.
  3. Best New Act at GEA. www.graphic.com.gh. Retrieved on 2019-07-08.
  4. ProfileAbility (2018-01-05). ProfileAbility – Sorakiss (en-GB). ProfileAbility. Retrieved on 2019-07-08.
  5. 'My honey' ft Akwaboah (en-US). Pulse.ng (2016-10-13). Retrieved on 2019-07-08.
  6. Abubakari (2016-12-31). It seems one of the 4syte TV presenters did not wear any underwear to the 4syte Music Video Awards (en). Yen.com.gh - Ghana news.. Retrieved on 2019-07-08.