Soumiya Iraoui

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Soumiya Iraoui
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMorocco Dezie
obodo maka egwuregwuMorocco Dezie
Aha enyereSoumiya Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Maachị 1996 Dezie
Ebe ọmụmụSalé Dezie
Asụsụ obodoBerber languages Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Berber languages Dezie
Ọrụ ọ na-arụjudoka Dezie
ebe agụmakwụkwọMohammed V University at Souissi Dezie
ụdị egwuregwujudo Dezie
so najudo at the 2020 Summer Olympics – women's 52 kg Dezie

Soumiya Iraoui (amụrụ na 19 Machị na afọ 1996) bụ onye Moroccan judo.[1] Ọ bụ onye nwetara ọlaọcha na African Games na onye nwetara ọla edo ugboro ise, gụnyere ọla edo abụọ, na African Judo Championships. Ọ nọchitekwara anya Morocco na afọ 2020 Summer Olympics na Tokyo, Japan.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

O meriri nrite ọla edo na ihe omume ya na afo 2018 African Judo Championships nke emere na Tunis, Tunisia.[2] O mekwara asọmpi na ihe omume ụmụ nwanyị nke 57 kilogram na afọ 2018 Mediterranean Games nke emere na Tarragona, Catalonia, Spain.

N'afọ 2019, o ritere ihe nrite ọlaọcha na asọmpi ụmụ nwanyị nke 52 kilogram na African Judo Championships nke emere na Cape Town, South Africa.[3] O nwetakwara ihe nrite ọlaọcha na ihe omume ụmụ nwanyị 52 kilogram na afọ 2019 African Games nke emere na Rabat, Morocco.[4] N'otu ọnwa ahụ, ọ gbakwara asọmpi na asọmpi ụmụ nwanyị 52 kilogram na afọ 2019 World Judo Championships nke emere na Tokyo, Japan.[5] Otu ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị, ọ meriri otu n'ime ọla nchara na ihe omume ya na afọ 2019 Judo Grand Prix Tashkent nke emere na Tashkent, Uzbekistan.[6]

O nwetakwara ihe nrite ọlaọcha na ihe omume a na 2020 African Judo Championships nke emere na Antananarivo, Madagascar.[7] N'afọ 2021, ọ sonyere na asọmpi ụmụ nwanyị 52 kilogram na Judo World Masters nke e mere na Doha, Qatar ebe Réka Pupp nke Hungary wepụrụ ya na egwuregwu mbụ ya.[8] Na afo 2021 African Judo Championship nke emere na Dakar, Senegal, ọ meriri nrite ọla edo na ihe omume ya.[9]

N'afọ 2021, ọ nọchitere anya Morocco na afọ 2020 Summer Olympics na Tokyo, Japan.[10] O sonyere na asọmpi ụmụ nwanyị nke 52 kilogram.[10] Ọ meriri egwuregwu mbụ ya na Kachakorn Warasiha nke Thailand ma Chelsie Giles nke Great Britain wepụrụ ya.[10] Giles gara n'ihu merie otu n'ime ọla nchara na ihe omume ahụ.[11][12] Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ọ tụfuru ọla nchara ya na ihe omume ya na Judo Grand Slam Abu Dhabi nke emere na Abu Dhabi, United Arab Emirates.[13]

Ihe ndị ọ rụzuru[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Egwuregwu Ebe Ụdị ịdị arọ
2018 Mmeri Afrịka Nke Mbụ -57 kilogram
2019 Mmeri Afrịka Nke Abụọ -52 kilogram
2019 Egwuregwu Afrịka Nke Abụọ -52 kilogram
2020 Mmeri Afrịka Nke Abụọ -52 kilogram
2021 Mmeri Afrịka Nke Mbụ -52 kilogram
2022 Mmeri Afrịka Nke atọ -52 kilogram

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Soumiya Iraoui. JudoInside.com. Retrieved on 19 December 2020.
  2. Rowbottom. "Iraoui wins first senior gold for Morocco at African Judo Championships", InsideTheGames.biz, 13 April 2018. Retrieved on 25 January 2022.
  3. 2019 African Judo Championships. African Judo Union. Archived from the original on 4 September 2019. Retrieved on 20 August 2020.
  4. Smith. "Egypt win four judo gold medals at 2019 African Games", InsideTheGames.biz, 19 August 2019. Retrieved on 25 January 2022.
  5. Women's 52 kg. 2019 World Judo Championships. Archived from the original on 5 December 2020. Retrieved on 5 December 2020.
  6. Morgan. "Jeong clinches second title at IJF Grand Prix in Tashkent", InsideTheGames.biz, 20 September 2019. Retrieved on 25 January 2022.
  7. 2020 African Judo Championships. African Judo Union. Archived from the original on 26 December 2020. Retrieved on 26 December 2020.
  8. 2021 Judo World Masters. International Judo Federation. Retrieved on 12 January 2021.
  9. Rowbottom. "Giantkiller Samy falls in final at 2021 African Judo Championships in Dakar", InsideTheGames.biz, 21 May 2021. Retrieved on 21 May 2021.
  10. 10.0 10.1 10.2 Judo Results Book. 2020 Summer Olympics. Archived from the original on 1 August 2021. Retrieved on 1 August 2021.
  11. Tokyo Olympics: Chelsie Giles wins Team GB's first medal with judo bronze. BBC Sport. Retrieved on 29 July 2021.
  12. Belam. "Chelsie Giles wins Britain’s first medal of Tokyo Olympics with bronze in judo", The Guardian, 25 July 2021. Retrieved on 25 January 2022.
  13. "A Real Treat", International Judo Federation, 26 November 2021. Retrieved on 25 January 2022.


Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]