Stella Atal

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Stella Atal
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereStella Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980s Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye mmebe ejiji Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2007 Dezie

 

Ezinaulona agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na mpaghara ugwu nke Uganda, n'akụkụ ugwu nke ọdọ mmiri Kyoga. Stella malitere ụlọ akwụkwọ ya na Kampala, isi obodo Uganda na obodo kachasị ukwuu. Ọ kwagara Kenya wee gaa n'ihu na agụmakwụkwọ ya n'ebe ahụ. Mgbe e mesịrị, ọ gụsịrị akwụkwọ na United Kingdom. O nwere nzere bachelors na nzere masta na Fine Art.[1][2]

N'afọ 2007, ọ malitere akara nke ya, Atal Stella . N'ebe ahụ, ọ na-elekwasị anya n'iji ihe dị na mpaghara, gụnyere eco-friendly, natural and re-cycled material. E gosipụtara ihe ndị omeputara na Africa Fashion Week New York, na 2010 na Green Fashion Switzerland, na 2011. E gosipụtara ọrụ Stella na mbipụta abụọ nke magazin a ma ama nke Italian Vogue .[3]

N'afọ 2016, o si Kampala, Uganda kwaga Paris, France. N'afọ sochirinụ, ọ natara ikikere nke na-enye ohere imepụta na ire uwe ya na ihe osise nwebisiinka na France na ndị ọzọ nke European Union. Ọ na-eme njem mba ụwa na Continental Europe, United Kingdom na United States.[2]

Stella Atal Meriri na ihe mmeri nke akporo African Designer of The Year site na Ethical Fashion Awards, nke emere na London n'afọ 2008. N'afọ 2010, omeriri na ihe mmeri ana akpo Afric Collection Fashion Award na Douala, Cameroon.[3]

Ọ na-akuziri ụmụ akwụkwọ nka na ụmụ akwụkwọ na-emepụta ejiji. Ọ na-arụkwa ọrụ na ndị gbara ọsọ ndụ na ndị ntorobịa nwere nsogbu, ọkachasị ụmụ agbọghọ. Na mgbakwunye, ọ na-arụ ọrụ na ndị ọrịa nje HIV / AIDS ma na Kampala ma na mpaghara ugwu nke ógbè ahụ.[1]

  1. 1.0 1.1 Ugandan Diaspora Team (22 December 2011). Ugandan Diaspora Social Networking Event ~ Showcasing Ugandan Fashion Designer ~ Stella Atal. Ugandandiaspora.com. Archived from the original on 29 March 2019. Retrieved on 29 March 2019.
  2. 2.0 2.1 Walter (14 October 2015). A Look At Stella Atal's Fashion Career. Chanos8.com. Archived from the original on 29 March 2019. Retrieved on 29 March 2019.
  3. 3.0 3.1 Klaart012 (October 2012). Kampala Contemporary Art Festival 2012: Designers: Stella Atal. Kampala Contemporary Art Festival 2012 (Klaart012). Retrieved on 29 March 2019.