Suzhou Industrial Park

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Suzhou Industrial Park
industrial zone
mba/obodoChina Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaSuzhou Dezie
nhazi ọnọdụ31°19′34″N 120°42′25″E Dezie
webụsaịtịhttp://www.sipac.gov.cn/english/ Dezie
Map

Ogige ụlọ ọrụ nke China -Singapore Suzhou, ma ọ bụ Suzhou Industrial Park na asụsụ bekee ma ọ bụ SIP na aha mkpụmkpụ ma ọ bụ aha ịchafụ bụ ebe emepụtara dị ka mpaghara maka nchịkwa nke dị na Suzhou, Jiangsu ma nwee obere mmetụta nke obodo Singapore.

Ntọala[dezie | dezie ebe o si]

Na afọ 1992, enwere echiche nke iwulite obodo mepere emepe nke oge a na ahụmịhe nke dị Singapore. N'oge njem ya na ndịda China n'afụ ahụ, onye isi ala China nke nwụrụ anwụ Deng Xiaoping kwuru, sị: "Singapore na -enwe ọmarịcha mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke ọma ma na ahazị ndụ na ụzọ dimma. Anyị kwesịrị imetụ ahụmịhe ha aka, ma mụta otu esi ejikwa mmadụ na ihe ndị ọzọ nke ọma karịa ha."

Ka emechara ọtụtụ mkparịta ụka na nyocha saịtị ebe enwere ike ịguzobe ebumnuche ha, gọọmentị abụọ ahụ (ndị China na Singapore) kpebiri ijikọ aka n'ịmepụta ogige mmepụta ihe ọgbara ọhụrụ na ọwụwa anyanwụ Suzhou. Otu a ka esi mụọ China-Singapore Suzhou Industrial Park (CS-SIP) na ọnwa February na ụbọchị iri abụọ na isii, n'afọ 1994 mgbe osote onye isi ala China Li Lanqing na onye isi ala Singapore Lee Kuan Yew bịanyere aka na Nkwekọrịta na Mmekọrịta maka iji wuo ma zụlite Suzhou Industrial Park na obodo Suzhou . [1]

Ọdịdị ala[dezie | dezie ebe o si]

Ọdọ mmiri Dushu na Suzhou Industrial Park

Mpaghara ebe SIP nwere ikike na mkpokọta dị kilomita narị abụọ na iri asatọ na asatọ, nke mpaghara mmekọrịta China na Singapore ruru kilomita iri asatọ. Ebe ahụ nwere ohere maka inwe ụlọ obibi nke ga abata mmadụ nke ọnụ ọgụgụ ya ga eru otu nde na narị abụọ. Kọmitii na-ahụ maka njikọta China na Singapore site na SIP nke nwere osote onye isi ala China, Wu Yi na osote onye isi ala Singapore Wong Kan Seng ga-enwe nzukọ kwa afọ iji nye ntuziaka maka mmepe na n'zụlite nke SIP. [2]

Ọdọ mmiri Jinji na Suzhou Industrial Park

Ọdọ mmiri Jinji ( nke a n'akpọ Golden Rooster Lake na asụsụ bekee) bụ obere ọdọ mmiri nke nwere mmiri ya n'adị ọhụrụ nke dị na etiti ogige SIP na Suzhou. Ọ nwere mpaghara kilomita asaa na ụma. na ịdị Omimi ya dị ihe dịka mita abụọ na ọkara ruo atọ. Enwere agwaetiti abụọ nke eji aka mmadụ ruo na abughị ọnatarachi nke dị n'ime ọdọmmiri ahụ akpọrọ Golden Rooster Lake na asụsụ bekee. [3]

Dushu Lake bụ a obere ọdọ mmiri nke na enwekwa mmiri ọhụrụ dị na ndịda nke Suzhou Industrial Park. Ọdọ mmiri a nọ na ebe dị ihe dị ka kilomita itoolu na ụma.

Akụ na ụba[dezie | dezie ebe o si]

Akụkọ pụtara na afọ 2019 na agha azụmaahịa nke US-China na -emetụta ogige SIP ahụ, karịsịa na mbupụ ahịa site na China gaa obodo ndị ọzọ nke ọnụ ọgụgụ ya gbadala pasent iri n'ime ọnwa asaa mbụ nke afọ 2019 ma e jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ nke afọ 2018, ebe ahịa mbubata site n'obodo ndị ọzọ daara pasent iri na ise n'otu oge ahụ. [4]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Mahadum na agụmakwụkwọ nke elu[dezie | dezie ebe o si]

Mahadum Xi'an Jiaotong-Liverpool nke dị n'ime Suzhou Industrial Park

Otu n'ime isi ọrụ gọọmentị bụ obodo maka agụmakwụkwọ nke elu nke akpọrọ Suzhou Dushu Lake Higher Education Town na asụsụ bekee. Ọ dị n'ebe ọwụwa anyanwụ nke Dushu Lake. Ọ nwere ngụkọta mpaghara kilomita nke dịiri abụọ na asatọ. A n'atụ anya na obodo a ga enwe ihe ruru narị puku mmadụ anọ ka ọ na erule afọ 2016, a na -atụkwa anya na otu narị puku n'ime ha ga -abụ ụmụ akwụkwọ. Ebumnuche mpaghara a na SIP bụ maka ịnye mmụta dị mma, teknụzụ dị elu, na ịnwe gburugburu ebe obibi dị mma. Mpaghara ahụ bụ ebe ọtụtụ mahadum (mahadum na ụlọ akwụkwọ maka ndị gụsịrị akwụkwọ nke mbụ na mahadum ma chọkwa ịgụ na aga n'ihu) gụnyere mahadum China na mahadum sitere na mba ndị ọzọ. Obodo a gbadoro anya na imepụta ndị gụrụ akwụkwọ na ndị nwere ike ịbụ ma ọ bụ imepụta ihe okike.[5] Mpaghara obodo SIP ahụ nwere akụrụngwa gụnyere ọba akwụkwọ, ebe ntụrụndụ, ogige, ebe egwuregwu na ebe obibi. Wenxing Plaza na Hanlin Plaza bụ ebe ama ama nke ọtụtụ obere ụlọ nri na ụlọ ahịa dị. Ọbá akwụkwọ Dushu Lake bụ ọbá akwụkwọ nnwale nke National Digital Library. Nnukwu mahadum gụnyere Suzhou University, Xi'an Jiaotong-Liverpool University na mahadum nke Renmin China, Suzhou Kampos.

Ihe Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

SIP banyere na oke nsogbu mgbe ndị ọrụ mpaghara ebe ahụ malitere iwu ebe ha kpọrọ Suzhou New District (SND) industrial park na asụsụ bekee iji soro ya mee mpi. Dika gọọmentị obodo Suzhou nwere naanị obere pasent iri atọ na ise na SIP, ebe ha nwere nnukwu pasent na SND, gọọmentị obodo ahụ bidoro leghaara SIP anya nke ukwuu wee lekwasị anya n'ịkwalite SND.

Ọrụ SIP kwesịrị ibunye ndị ọrụ China ikike, nghọta na njikwa site n'aka ndị Singapore ma kụziri ndị China otu esi arụ ma na-agba ogige ntụrụndụ azụmahịa nke ọma na ụzọ ga-eme azụmahịa adị mfe. Mana ọ mechara ihe gbasara SIP mebie mmekọrịta dị n'etiti Singapore na China. Ọmekwara ndị Singapore enwe ezigbote nghọta ihe a na -atụghị anya ya, na mgbe ụfọdụ ụzọ okpuro nke dị ka omenala azụmahịa nke ala ndị Kọmunist China. [6]

Lee Kuan Yew onye isi ọchichi nke Singapore tinyere aka na mmehe Suzhou Industrial Park

Onye isi minista Singapore, Lee Kuan Yew kwetara na ọrụ ahụ adịbeghị dị ka emebere ya ma ọ bụ ka esiri tuọ anya ma mee ka ọ kpachara anya maka itinye ego na azụmahịa na China. Ọ rụtụrụ aka n'ihe isi ike bilitere na ịbịanye aka na nkwekọrịta gọọmentị etiti na ndị ọrụ na ime obodo nke mere ebe ndị ọrụ a nwere ihe dị mkpa nke ha bụ na obi ime na abụghị ebumnuche gọọmentị etiti. [6]

Mgbe emefuru ego ruru nde iri itoolu mfu na ihe karịrị afọ ise, [7] ụlọ ọrụ Singapore wedara ego na oke ha na SIP ruo pasent iri atọ na ise, nke mere na -ebuliri eo na oke nke ụlọ ọrụ China ruo pasent pasent iri isii na ise site na pasent iri atọ na ise. Ha belata òkè Singapore site na kilomita iri asaa e mere n'atụmatụ ruo na naanị kilomita asatọ. [8] Ndị otu China họpụtara Wang Jinhua, osote onye isi obodo Suzhou na onye bụbu onye njikwa nke New District, ka ọ bụrụ onye isi ọhụrụ nke SIP.

Mgbe ihe mechara gaa nke Ọma[dezie | dezie ebe o si]

Na afọ 2001, otu afọ mgbe Singapore wedatara ego na oke ha, ogige SIP ahụ nwetara uru mbụ ya nke pụtara nde $ ato n'ụma. [9] Na mbụ ewere n'SIP dị ka ihe dara-ada nke nwere ọtụtụ ndọghachi azụ mana ọ mechara bụrụ ihe n'aga nke ọma mgbe afọ iri abụọ na ise gachara. Ka ọ na -erule afọ 2020, SIP tụnyere ihe dị ka ijeri yuan narị asatọ (ijeri $ otu narị na iri na itoolu na ụma) na ego ụtụ isi, wee nweta ihe karịrị otu puku ijeri $ azụmaahịa ọwebatara site na mba ndị ọzọ. [10] SIP, dịka akụkụ nke Suzhou New District (SND) abụrụla ebe mmepe n'afọ ndị na -adịbeghị anya. Ihe ịga nke ọma nke SIP dị ka ụzọ itinye ego na amụpụta ego etinyela aka na ime gọọmentị Suzhou ka ha machibido ihe mgbochi ihe ruru ugboro anọ na afọ 2019 iji mee ka oke ọnụ ahịa ụlọ na ala dị na SIP kwụsịlata. [11]

Gọọmentị Korea emela mpaghara Kaesong Industrial Region mgbe ha hụrụ ihe ịga nke ọma nke SIP. [12] Ogige mmepụta ihe ọzọ nke emere na oyiyi SIP bụ Ogige Mmepụta China-Belarus . [13]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Sino-Singapore Tianjin Eco-obodo
  • Ọdọ Mmiri Jinji
  • Ọdọ mmiri Dushu
  • Ọnụ ụzọ ámá ọwụwa anyanwụ
  • Wheel Suzhou Ferris
  • Suzhou Industrial Park Railway Station

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. see Alexius A. Pereira (2003) State Collaboration and Development Strategies: The Case of the China Singapore Suzhou Industrial Park (1992-2002). London: Routledge.
  2. Suzhou Industrial Park. RightSite.asia (1994-02-26). Retrieved on 2012-02-07.
  3. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (zh-hans). Retrieved on 2012-06-28.
  4. In a giant industrial estate, Chinese officials scramble to keep foreign tenants. South China Morning Post (September 15, 2019).
  5. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (zh-hans). Sipedi.com. Archived from the original on 2012-02-07. Retrieved on 2012-02-07.
  6. 6.0 6.1 Richardson (October 1, 1999). Singapore Industrial Park Flounders : A Deal Sours in China.
  7. "Losses in Singapore Suzhou project to hit US$90 million", Agence France-Presse, September 15, 1999
  8. "Suzhou project: wounded pride". Ben Dolven, Far Eastern Economic Review, July 8, 1999.
  9. "The new frontier". Ben Dolven, Far Eastern Economic Review, December 6, 2001.
  10. Suzhou Industrial Park celebrates 25 years. China Daily (April 12, 2019).
  11. Suzhou tightens property curbs for the fourth time in 2019 as overheating home market has defied policies to cool prices. South China Morning Post (July 25, 2019).
  12. 外媒:韩朝欲国际化开城园区 效仿苏州工业园 (zh-hans). Sohu (August 17, 2013).
  13. Interview: China-Belarus Industrial Park propels Belarusian economy. Xinhua (August 11, 2018). Archived from the original on August 18, 2018. Retrieved on August 31, 2021.