Tony Payne

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Tony Payne
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereTony Dezie
aha ezinụlọ yaPayne Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Eprel 1955 Dezie
Ebe ọmụmụNjikota Obodo Amerika Dezie
Ọrụ ọ na-arụdarts player Dezie
ụdị egwuregwudarts Dezie

Thomas Anthony Payne (amụrụ na 10 Eprel 1955 na Owensboro, Kentucky) bụ onye Amerika lara ezumike nká na-eme egwurewgu nke a akpọrọ darts. A makwaara ya nke ọma maka ibipụta otu edemede na Bulls Eye News magazin ama ama nke akpọrọ "Thermonuclear Cricket".

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Payne gbara ụgbọro asaa na-asọmpi nke BDO World Darts Championships, mana ọ bụ naanị otu egwuregwu ka ọ meriri na 1991, ebe o meriri Chris Johns, Phil Taylor mechara merie ya n'agba nke abụọ. Na mpụta ya ndị ọzọ niile, e meriri ya na agba nke mbụ n'aka Eric Bristow (1987), Cliff Lazarenko (1988) na Bob Taylor (1994). Payne, ya na Davy Richardson na Steve West, bụ otu n'ime ndị egwuregwu atọ tufuru egwuregwu ise mbụ ha na asọmpi mba uwa.

N'agbanyeghị ndekọ ya na asọmpi nke mba ụwa adịghị mma, Payne mere nke ọfụma na egwuregwu BDO ndị ọzọ, rute na nke ikpeazụ na 1985 WDF World Cup ebe ọ meriri Bristow ma rute ọkara nke ikpeazụ nke 1985 Winmau World Masters ebe Ray Farrell nke Northern Ireland meriri ya. Otu n'ihe kachasị mma e jiri mara Payne bụ mmeri o meriri Steve Brown maka asọmpi nke ha zọrọ na 1990 nke bụ Lucky Lights Challenge of Champions.

Na July 1994, Payne gafere nkewa nke egwuregwu darting ọ bụ otu n'ime ndị Amerika iri na otu a kpọrọ ka ha sonye na asọmpi nke PDCWorld Matchplay. Onye otu Amerịka Paul Lim meriri ya na nke mbụ ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, Payne lara ezumike nká, na-ekpebi ịnwe oge ka ya na ezinụlọ ya na ugbo ọhụrụ ahụ. Agbanyeghị na 2003, Payne laghachiri egwuregwu ahụ wee tozuo maka Las Vegas Desert Classic, onye egwuregwu Amerika mbụ tozuru etozu mgbe a na-ele ya na telivishọn, ebe ọ tufuru egwuregwu mbụ ya na aka Steve Beaton mana merie Ronnie Baxter 8-1 nke nyere ya a ezigbo ohere itozu maka agba ọzọ. Ma, Beaton gara n’ihu merie Baxter ma merie otu ha. Payne sonyere na-egwuregwu 2004 PDC World Darts Championship na 2004 mana ọ Steve Maish meriri ya na agba nke mbụ.

Nsonaazụ Asọmpi mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

BDO[dezie | dezie ebe o si]

PDC[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]