Gaa na ọdịnaya

Tropical night

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

A tropical night bụ okwu a na-eji n'ọtụtụ mba Europe akọwa ụbọchị mgbè okpomọkụ anaghị ada n'okpuru Celsius iri abụo (68.0 ) n'ogè abalị.[1] A na-eji nkọwa a eme ihe na mba ndị gụnyere United Kingdom, Republic of Ireland, Spain, Sweden, Norway, Netherlands, Germany, Finland, Lithuania, Latvia, Hungary, Serbia na Croatia. Na United States n'ụzọ dị íchè, a na-eji ókwú ahụ bụ "abalị na-ekpo ọkụ" eme ihe mgbè okpomọkụ anaghị ada n'okpuru Celsius iri abụọ (80.6 ) na steeti Gulf na Atlantic.

A na-ahụkarị abalị ndị na-ekpo ọkụ n'ogè oke okpomọkụ ma na-emekarị n'oké osimiri, ụsọ mmiri nà ọdọ mmiri. A na-echekwa okpomọkụ na mmiri n'ogè anwụ na-acha ma na-ekpo ọkụ n'ehihie, nke a na-ewepụta n'abalị ma mee kà okpomọkụ abalị dị elu.[2]

United Kingdom

[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ Met bidoro ịchọpụta 'abalị okpomọkụ' n'afọ 2018.[3][4] A naghị emezu ụkpụrụ a ugboro ugboro, na afọ iri atọ n'etiti 1961 na 1990 na-ahụ abalị 44 na-ekpo ọkụ, ọtụtụ n'ime ha metụtara oge okpomọkụ nke afọ 1976 na 1983. Site na 1991 ruo ụbọchị iri na abuo n'ọnwa Ọgọst 2020, e dekọrọ abalị iri asatọ na anọ dị otú ahụ, ébé iri abụọ na otu n'ime ha mèrè kemgbe afọ 2008. E dekọrọ abalị ise nke nọrọ n'elu 20 °C na 2018, na anọ na 2019. Ka ọ na-erule n'abalị iri na otu n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2020, edekọla abalị anọ nke okpomọkụ maka afọ ahụ, otu n'ọnwa Juun June na atọ na August.[5]

N'oge okpomọkụ nke July 2022 , a kọrọ na abalị okpomọkụ e dekọrọ n'otu abalị site n'ubochi irí na asatọ ruo iri itoolu n'ọnwa Julaị bụ nke kachasị ọkụ na ndekọ, ebe okpomọkụ n'ọtụtụ akụkụ nke mba ahụ adaghị n'okpuru 25 °C. E debere abalị kachasị ọkụ na 18 July 2022 na Croydon na-eru 25.9 °C na-emebi ndekọ gara aga nke 23.9 °C.[6]

Na Croatia, a na-akpọkarị ihe omume a 'abalị na-ekpo ọkụ' (Croatian: ),: 32 ma bụrụkwa tropska noć ('abalị na-okpomọkụ').[7][8][9] 'N'abalị na-ekpo ọkụ' (vrlo topla noć) na-eme mgbè okpomọkụ dị n'elu 25 °C (77.0 ) n'otu abalị.[10] N'oge okpomọkụ, abalị ndị na-ekpo ọkụ na-eme mgbè niile n'akụkụ oké osimiri n'oge ok okpomọkụ. N'afọ 1961, e nwèrè nkezi nke abalị irí ruo irí abụọ n'ọnwa n'ogè ọkọchị n'akụkụ oké osimiri: 32 mànà ihe na-erughị otu kwà afọ n'ọtụtụ mpaghara Croatia: 41 Otú ọ dị, ha abụrụla ihe a na-ahụkarị na Zagreb kemgbe afọ 2000.[7][7][8] N'ime afọ 1990 na 2014, Zagreb dekọrọ mmụba nke abalị 19.5 ọzọ na-ekpo ọkụ kwa afọ iri.[11] N'ọnwa Ọgọstụ 2018, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe ndị na-ahụ anya na Zagreb Grič debanyere aha abalị iri abụọ na anọ nke okpomọkụ, na-emeri ihe ndekọ gara aga site na 2003.[12]

Na Ireland, a hụrụ abalị abụọ na-ekpo ọkụ na Valentia Observatory na County Kerry n'oge oke okpomọkụ n'ọnwa Julaị 2021.[13] Nke a bụ ógè mbụ e dekọrọ abalị abụọ na-ekpo ọkụ n'usoro na Ireland.

  • Oké okpomọkụ
  • Agwaetiti okpomọkụ nke obodo

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ McGrath, Matt (2 November 2018). "Weather: UK experiencing hotter days and 'tropical nights' - Met Office". BBC. Retrieved 9 April 2019.
  2. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  3. ↑ "Potential record-breaking heat today". Met Office (in Bekee). 25 July 2019. Retrieved 26 July 2019.
  4. ↑ Knapton, Sarah (2 November 2018). "Met Office starts tracking 'Tropical Nights' in Britain as weather becomes more extreme". The Telegraph. Retrieved 26 July 2019.
  5. ↑ Smith, Daniel (11 August 2020). "Steamy 'tropical nights' ahead as heatwaves become more common in UK". WalesOnline.
  6. ↑ Cuff, Madeleine (19 July 2022). "Why 'tropical nights' when temperatures fail to drop below 20°C are so harmful". inews.co.uk. Retrieved 19 July 2022.
  7. 1 2 3 Zaninović, ed. (2008). Climate atlas of Croatia, 1961–1990, 1971–2000 (PDF) (in Bekee and Croatian). Zagreb: Croatian Meteorological and Hydrological Service. ISBN 978-953-7526-01-6. Retrieved 14 August 2021.
  8. 1 2 "Toplinski val - što, gdje, kada i do kada?" (in Croatian). Croatian Meteorological and Hydrological Service. 13 June 2019. Retrieved 14 August 2021.
  9. ↑ Paić, Vinko (18 June 2021). "Dalmatinci, pripremite se za toplotni udar! Meteorologinja Tea Blažević najavljuje 'tropske noći': Dašak svježine mogao bi donijeti tek maestral s mora". Slobodna Dalmacija (in Croatian). Retrieved 14 August 2021.
  10. ↑ "Dinamičan završetak klimatološkog ljeta" (in Croatian). Croatian Meteorological and Hydrological Service. 28 August 2020. Retrieved 14 August 2021.
  11. ↑ Gaćeša-Zaninović, Ksenija (23 December 2015). "Temperatura zraka u Zagrebu u razdoblju 2011. - 2014" (in Croatian). Croatian Meteorological and Hydrological Service. Retrieved 14 August 2021.
  12. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  13. ↑ Best, Barra (23 July 2021). "Extreme heat: Ireland records two tropical nights in a row". BBC News. Retrieved 12 January 2022.