Tufo (agba egwú)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Tufo bụ ịgba egwú ọdịnala na mbà Northern Mozambique . Ọ bụ ìgwè ụmụ nwanyị n'agba egwú ahụ ma n'ahụ ya na Maputo, mpaghara Cabo Delgado na Nampula na Agwaetiti Mozambique.[1][2] N'ịbụ nke sitere na Ndị Arab, a na-agba egwú ahụ iji mee ememme na ezumike ndị Alakụba.[3] Ndị n'agba egwú n'agba egwu n'agagharị naanị n'elu ọkara nke ahụ ha ma n'esonyere abụ na ịgbà dị ka tambourine.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Mmalite nke tufo edoghị anya, [3] ọ bụ ezie na ọ dị n'agwaetiti mbà Mozambique, akụkọ ifo kwụrụ na ịgba égwú a malitere n'oge onye amụma Islam Muhammad kwagara Medina. [4] Ndị n'eso ụzọ ya nabatara ya site n'abụ na ịgba egwú n'eto Chineke, tinyere ịgbà. Ebe ọ bụ na Muhammad kwàdòrò ịgba egwú ndị a, a nọgidere n'eme ha n'ememme okpukpe.[2] Tufo nwere ike ịbịa mbà Mozambique n'afọ ndị 1930, onye ọchụnta ego si Kilwa aha ya bụ Yussuf wetara ya.[1][2] O yikarịrị ka aha ahụ sitere na aha Arabic maka ịgbà eji agba egwu, ad-duff.[2] Okwụ a ghọrọ adufe ma ọ bụ adufo na Portuguese, na tufo.[2][4]

  1. Cristalis (2005). Independent women: the story of women's activism in East Timor. CIIR, 115. ISBN 1-85287-317-5. 
  2. Fitzpatrick (2007). Mozambique. Lonely Planet, 33. ISBN 978-1-74059-188-1. 
  3. Sheldon (2005). Historical dictionary of women in Sub-Saharan Africa. Scarecrow Press, 247. ISBN 0-8108-5331-0. 
  4. 4.0 4.1 Arnfred (2005). "Tufo Dancing: Muslim Women's Culture in Northern Mozambique", in Patraquim: Médias, pouvoir et identités. KARTHALA Editions. ISBN 2-84586-594-5.