Ugochukwu Oduenyi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ugochukwu Oduenyi
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereUgochukwu Dezie
aha ezinụlọ yaOduenyi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Febụwarị 1996 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuLASK Linz Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
Ugochukwu Oduenyi

  Ugochukwu Ogbonnaya Oduenyi (amụrụ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Febụwarị afọ 1996) bụ onye Naijiria na-agba bọọlụ nke na-agbachitere FK Sūduva..

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Oduenyi malitere ọrụ ya na ụlọ akwụkwọ Emmanuel Amuneke a ma ama na Lagos, Naijiria.

Austria na Croatia[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2018, Oduenyi hapụrụ ụsọ mmiri nke Naịjirịa wee bịanye aka na klọb Austrian Bundesliga LASK. O dere nkwekọrịta afọ abụọ na klọb Austrian mana a gbazinyere ya na Croatian Second Football League NK Sesvete.

N'ọnwa Ọktoba nke afọ 2018 o mere mpụta nke mbụ ya maka Sesvete na Croatian Second Football League mgbe ọ bịara dị ka onye nọchiri Mario Vasilj na nkeji nke iri isii medige NK Bijelo Brdo na ụbọchị egwuregwu nke asatọ nke oge 2018-19. Mgbazinye ahụ kwụsịrị n'oge ezumike oyi nke oge ahụ.

Oduenyi gara mgbazinye na 2. Liga . Klọb Liga SV Horn n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019. O mere nke mbụ ya na ngalaba nke abụọ na SV Horn na'ọnwa Febụwarị afọ 2019, mgbe ọ nọ na mmalite ndị bidoro megide FC Liefering na ụbọchị egwuregwu nke iri na isii nke oge ahụ ma jiri Kelvin Arase dochie ya na nkeji nke iri ise na asatọ.

N'ọnwa Septemba nke afọ 2019, Oduenyi bịanyere aka na klọb Austria ọzọ SV Ried no na nkewa nke abụọ. Ọ bụ otu n'ime ihe gara nke ọma mere ndị otu ya iji nweta nkwalite na Austrian Bundesliga na 2020 ma a tọhapụrụ ya mgbe nkwekọrịta ha gwụsịrị.[1]

Ukraine na Kazakhstan[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2021, Oduenyi bịanyere aka na Mynai ka ọ sonye na ndị otu Ukraine Premier League dị ka onye ọkpụkpọ n'efu ma nye ya uwe elu No. 9 a ma ama.[2] Oduenyi mere egwuregwu nke mbụ ya na Mynai n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2021.[3]

N'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2021, Zhetysu kwupụtara mbinye aka Oduenyi.[4]

Lithuania[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Eprel afọ 2023, ọ mara ọkwa na ya na Hegelmann Clubnke Lithuania bịanyere aka.[5] N'abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Eprel afọ 2023, o mere mpụta nke mbụ ya na A lyga megide DFK Dainava.[6]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Champion in Austria Ugochukwu Oduenyi aims for the top (en-US). Score Nigeria (4 August 2020). Retrieved on 24 February 2021.
  2. Ukrainian Club FC Minaj signs Oduenyi - The Nation (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (21 January 2021). Retrieved on 24 February 2021.
  3. ‘Majestic Oduenyi’ makes Ukraine debut. thelagostempong.com/. The Lagos Tempo (14 February 2021). Archived from the original on 28 June 2023. Retrieved on 25 August 2021.
  4. ДОБРО ПОЖАЛОВАТЬ, УГО! (Russian). fc-zhetisu.kz/. FC Zhetysu (25 August 2021). Retrieved on 25 August 2021.
  5. https://www.sportas.lt/naujiena/475904/hegelmann-gretose-puolejas-is-nigerijos
  6. https://alyga.lt/rungtynes/2023-04-23-dainava-hegelmann/1543

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Ugochukwu Oduenyi at FootballDatabase.eu
  • Ugochukwu Oduenyi at Soccerway